Lekki Toll Gate: A ga-enyocha ndị uweojii mekpara Mr Macaroni na ndị ọzọ ahụ

Onyeisi ndị uweojii na Legọs steeti, bụ Hakeem Odumosu, enyela iwu ka e nyochaa ndị uweojii mekpara ndị e jidere na ngagharịiwe Lekki Toll gate ahụ n'ụbọchị Satọde.
Olumuyiwa Adejobi, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị.
Cheta na ihe onyonyo pụtara na soshal media nke gosiri ụfọdụ n'ime ndị ahụ anwụchiri ebe ha nọ n'ime otu ụgbọala gbarachaa ahụ nkịtị.
Hakeem Odumosu kwuru na ya enyela ikike ka e nyochaa ndị uweojii mere ihe ahụ ma taa ha ahụhụ kwesịrị ha.
O kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii ga-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ mere ihe iwu kwuru, mana ha agaghị agbachị nkịtị ka ụfọdụ ndị otu ha na-emekpa ndị mmadụ ahụ n'ụzọ ekwesịghị ekwesị."
Odumosu gara n'ihu rịọ ndị bi na Legọs ka onye ọbụla na-agara mkpa ya ma zeere ihe ọbụla nwere ike ibute ọgbaaghara.
Ndị uweojii tiri anyị ihe ma gbaa anyị ọtọ - Mr Macaroni

Ebe foto si, Debo Adebayo twitter page
Ka ndị uweojii tọghapụchara ya, Debo Adebayo, onye e ji Mr Macaroni mara ekwuola na e tiri ma gbaa ya na mnadụ 39 anwụchịkọrọ ya na ha ọtọ na Lekki Toll Gate ụnyahụ.
O kwukwara na ọ chọbụghị ipụta n'ebe ahụ mbụ maka oke ụjọ ji ya mana mgbe ọ na-agafee hụ ka ịhe si kwụrụ, ọ ga-akwụnyere ndị ntoroọbịa iri atọ na itoolu ahụ pụtara ime ngaghariwe n'ebe ahụ.
O kwuru ka ndị mmadụ jiri nwayọ makana gọọmenti etiti achọghị ịma onye bụ onye, "ndị a ga-egbu onye ọbụla kwụchịrị ha ụzọ."
Lee okwu mbụ Mrmacaronii kwuru ka ndị uweojii tọghapụchara ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị uweojii ekwuola na ọbụ maka ịda iwu Covid ka e ji nwuchie Mr Macaroni na ndị ọzọ

Ebe foto si, Twitter/Sowore
Cheta na ndị uweojii tọhapụrụ Debo Adebayo, onye e ji Mr Macaroni mara, na mmadụ iri atọ na itoolu ndị ọzọ bụ ha nwụchiburu na ngagharịiwe e mere na Lekki Toll gate n'ụbọchị Satọde.
Omoyele Sowore, onye nwe ụlọ ntaakụkọ Sahara Reporters, kwupụtara nke a n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye ọzọ kwukwara na a kwụrụ otu narị puku naịra iji gbapụta Mr Macaroni.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndị uweojii kwuru na ọ bụ maka na ndị ahụ na-eme ngagharịiwe dara iwu Covid-19 mere e ji nwuchie ha.
Muyiwa Adejobi, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs, kwuru na ọ bụ ụlọikpe tọhapụrụ ndị ahụ ha jidere, ma kwukwaa na ha ga-abịakwa ọzọ n'ụlọikpe n'ụbọchị abụọ nke ọnwa March afọ 2021.
Falz, Charly Boy Amnesty International etinyela ọnụ na ngagharịiwe End SARS

Ebe foto si, Instagram/Falz/Charlyboy/Atiku
Ọtụtụ ndị ama ama etinyela ọnụ katọọ aka ike ndị uweojii dịka ndị ntorobịa mere ngagharịiwe ọzọ na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Satọde, abalị iri na atọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021.
Folarin Falana, onye oti egwu eji Falz mara, kwuru na ike Naịjirịa agwụla ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Falz kwukwara na gọọmentị Naịjirịa egosila na ha achọghị udo chaachaa.

Ebe foto si, Twitter
Charles Oputa, onye e ji Charly Boy mara kwuru na Naịjirịa aghọọla ọgbọ ebe a na-egbu mmadụ.

Ebe foto si, Twitter
Osote Onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Abubakar Atiku kwuru na ihe ndịọrụ nchekwa kwesịrị ime bụ inye aka hụ na ndị na-eme ngagharịiwe mere ya n'udo.
Atiku dọrọ aka na ntị ka onyeisiala Naịjirịa wepụ aka enwe n'ofe.

Ebe foto si, Twitter
Onye omeiwu bụ Shehu Sani kwukwara otu ihe ahụ Atiku kwuru.

Ebe foto si, Twitter
Amnesty International kpọrọ oku ka gọọmentị Naịjirịa chekwaa ndị na-eme ngagharịiwe na-emebighi ihe ọbụla.

Ebe foto si, Twitter
Ndị uweojii nwụchiri onye ọkpa ọchị Mr Macaroni na Lekki Toll Gate

Ebe foto si, Mr Macaroni
Otu onye na-eme ejije ụkaọchị bụ Debo Adebayo, onye e ji Mr. Macaroni mara, so na ndị a nwụchịrị n'ụtụtụ Satọde a na Lekki Toll Gate.
A hụkwara ya na Twitter ebe ọ na akọwa ihe na-eme n'ime n'ihe onyonyo n'ime ụgbọala "Black maria" ebe ọ nọ.
Onweghị onye hụrụ mgbe ejidere ya.
Ihe ahụrụ bụzị ebe ọ nọ na Twitter na-eme ya bụ ihe onyonyo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Lee ihe onyonyo ọzọ gosiri ebe Mr Macaroni nọ n'ime ụgbọala ebe ndị uweojii debere ya na ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Ọ kwụsịrị ya bụ ihe onyonyo ọ na-eme mgbe ndị uweojii napụrụ ya ekwentị ya.
Onye ntaakụkọ BBC na-akọwa na agbanyeghị ihe karịrị mmadụ iri a nwụchịrị, na ụgbọala na-agbafekwa ebe ahụ were were.
Otu nwoke nọ n'ime "Black Maria ahụ na-eti mgbu na ya na-aga ụlọọrụ ya tupu aka akpara ya.

Ọ na-ekwu na ọnweghị ihe ya mere.
Ya bụ nwaadị na-ajụ ndị uweojii "ọ bụ na m enweghị ikike ịgagharị n'ala m?"
Mana ọ nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ.
Ya bụ nwaamadị na-ekwu na ọ bụ onye Njinia were ndị mmadụ n'ọrụ, mana ọnweghị onye ghere ya ọnụ.

A chọpụtara na ahụ e sichaghị ụgbọala ndị uweojii ji buru ndị ahụ ike dịka akwawara ya aka mana ọ nweghị ike ịnupu.
E mechere kpọrọ ndị ahụ banye n'ụgbọala ọzọ were pụwa.
Nwaandị sị na aha ya bụ Christopher Udoji bụ ọnye nwetere onwe ya na ụgbọala ndị uweojii ahụ sị na ya na-agafe agafe tupu anwuchie ya.
Ụfọdụ ndị anwụchịrkwara kwetakwara na n'ezie, ha pụtara ya bụ ngagharịiwe.
Ndị uweojii na ndị agha Naịjria wuchiri n'uju na Lekki Toll Gate ebe ndị ntorobịa siri ọnwụ na ha ga-amaliteri ngagharịwe taa bụ Satụde.
Ndị ọrụ BBC nọ ebe ahụ kemgbe elekere isii nke ụtụtụ ịwetere unu ka ịhe sị aga.

BBC hụrụ ọtụtụ ndị uweojii na ndị agha Naịjriịa ka ha kposara ebe ahụ.
Ha hụkwara ụfọdụ umu ntorobịa pụtara ebe ahụ, ụfọdụ n'ime ha ka anwụchiri tụba n'ụgbọala ndị ụweojii buru pụọ.

Dịka ndị BBC nọ ebe ahụ siri kwuo, "ndị uweoji nwuchiri ụfọdụ ndị pụtara ebe ahụ".
Otu onye okoroobịa a nwụchiri kwuru na ya bịara nleta ihe na-eme na-ebe ahụ, mana ndị uweojii nwụrụ ya tinye a n'ụgbọala Bekee kpọrọ "Black Maria".

Cheta na-ana atụ anya na ndị ntoroọbịa ga-apụta taa maka ngagharịiwe atụmatụ ọgbakọ na-enyocha mmegide ndị uweojii ka enyeghachie ụlọ ọrụ "Lekki Concession Company" (LCC) ogige Toll Gate ahụ ka ha malite tụwa mgbere n'ebe ahụ.Ọ bụ na Lekki Toll Gate ahụ ka anọ mee ngagharịiwe n'Ọktoba 2020 butere ebubo na egburu ndị mmadụ.

Ọ bụ ebubo ogbugbu mmadụ butere ngagharịiwe a dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ya bụrụ na-afụghị isi ogbugbu ha, ekwesighi imepe ya bụ Toll Gate.
Otu onye anwụchịrị ebe ahụ na-akọwa na ọ bụ ya bụ ngagharịiwe ka ya pụtara tupu ndị uweojii akpara ya aka.

Ụfọdụ ndị ụmụntorobịa ahụ anwụchịrị ekweghị ekwe o, dịka ha ka na-aba mba na ha nwereikike ịpụta mee ngagharịiwe n'udo.
Onye ntaakụkọ BBC na-ekwu na amaghị ihe ọtụtụ so na ndị anwụchịri mere ndị uweojii ji kpara ha aka.

Ọ kwuru na ha anwuchiela ihe karịrị mmadụ iri ebe ahụ n'ụtụtụ a.
Ọtụtụ ndị ọzọ jukwara ebe ahụ bụkwa ndị ntaakụkọ sị ụlọọrụ ntaakụkọ dị ichie iche.












