Curfew in Lagos: Nchịkọta ihe niile mere na Lekki toll gate n'abalị Tuzde

Ebe foto si, Getty Images
Mkpu akwa dara n'ụbọchị 20 ọnwa Ọktoba nke afọ 2020 na Lekki Toll Gate, ebe ndị ntoroọbịa Naịjirịa na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu ndị uweojii.
Nke a mere mgbe ndị yi uwe ndịagha Naịjirịa batara ebe ahụ malite ịgba ha egbe, nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.
BBC amabeghị kpọmkwem mmadụ ole nwụrụnụ.
Kedụ mgbe ogbugbu a malitere?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọgbaaghara malitere ịbata na ngagharịiwe nke a malitere kamgbe izuụka abụọ gara aga, steeti dị icheiche malitere itinye iwu mmachi mkpagharị.
Gọvanọ Sanwo-Olu tikwara iwu a, n'ụbọchị Tuzde mana ndị ntoroọbịa nọ na Lekki 'toll Gate' nakwa Alausa na-eme ngagharịiwe jụrụ ịla n'ụlọ ha gafee oge mmachi mkpagharị malitere.
N'ihe dịka elekerei asaa nke abalị ka ụda egbe malitere ịda aghara aghara n'ebe ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe.
Ihe onyonyo si ebe ahụ pụta na-egosi ka ndịagha na-agba ndị a egbe nke butere ọtụtụ ọnwụ na mmerụ ahụ ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Otu anya hụrụ ka ihe ji mee sị na ndịagha bịara dịka ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa ma malite ịgba egbe; ha mechikwara ụzọ ha nwereike isi gbaa ọsọ.
Onye ahụ kwuru sị: "Ha nọ na-agba anyị egbe dịka ha na-erute anyị nso. Ọ bụ ihe ọ gbaghara. Egbe gbatara otu nọ n'akụkụ m ya nwụọ ozugbo.
"O bụ ihe ọgbagbara dị egwu dịka ndị gbara anyị egbe ruo otu awa na ọkara. Ha nọkwa na-eburu ozu ndị nwụrụ anwụ."
Otu onye otiegwu aha ya bụ DJ Switch malitere iji ekwentị ya gbasawa onyonyo ihe na-eme ebe ahụ site n'akara Instagram ya.
Etu ngagharịiwe si malite?

Ebe foto si, Nora Awolowo
Kamgbe izuụka abụọ ka otụtụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa malitere ime ngagharịiwe mgbe ihe onyonyo gosiri ebe ndị uweojii wakporo ma kwatuo nwokorọbịa site n'ụgbọala n'obodo Ughelli dị na Delta Steetị.
Ngagharịiwe malitere na Legọs na Abuja ma zuo ọtụtụ Steetị na Naịjirịa nke gụnyere Rivas, Enugwu, Abia, Imo, Akwa Ibom, Ekiti na ndị ọzọ.
Ha kporo oku ka e kposasịa ngalaba uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' SARS bụ ndị kparala ọtụtụ arụ, ọzọ bụ ka aghazigharịa uweojii na Naịjirịa na ihe ndị ọzọ.
Onyeisiala Muhammadu nọrọ n'ụbọchị 11 ọnwa Ọktoba kposaa ngalaba uweojii SARS.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana ndị ntoroọbịa jụrụ ịpụ n'ụzọ na-ekwu na gọọmentị emezubeghi ihe ha chọrọ.
Dịka ngagharịiwe na-aga n'ihu, ndị ekperima jizi ohere ahụ na-akpa arụ n'ọtụtụ ebe dị iche iche nke gụnyere izu ohi, igbu mmadụ, ịwakpo ụlọ ndị uweojii nakwa ịkpọ ya ọkụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nke a mere ndị ọchịchị ji tinye iwu mmachi mkpagharị.
Kedụ ihe ndịagha Naịjirịa kwuru?
Dịka akụkọ a malitere ifesasị ebe niile na soshal midia, ndịagha Naịjirịa pụtara n'akara twitter ha kwuo na onweghi mgbe ha zipuru ndịagha na Lekki Toll Gate.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Gọvanọ Sanwo-olu nke Legọs Steetị kwuru na ọ bụghị gọmentị ya zipuru ndị mere ihe a.
Dịka o si sụọ ya na bekee, o kwuru na ọ bụ "forces beyond our direct control" mere ya bụ ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ọ gakwara n'ụlọogwụ ebe ndị merụrụ ahụ nọ, ma kwuo na ya enyela iwu ka emee nnyocha banyere ya.
Mana otu na-ahụ maka ikike dịrị onye n'ụwa bụ 'Amnesty International Nigeria' nke Naịjirịa sị na ha anatala ozi banyere ogbugbu ndị mmadụ na Lekki Toll Gate.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Onyeisi ha bụ Isa Sanusi kwuru "Ndị ọrụ nchekwa gburu ndị mmadụ na Lekki tollgate...anyị na-agba mbọ inyocha ya."
Ihe ndị a ma ama kwuru banyere ya

Ebe foto si, Biden Website
Joe Biden, onye na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka, nakwa Hillary Clinton one zọburu ọkwa onyeisiala Amerịka n'oge gara aga tinyere ọnụ n'okwu a.
Ha kpọrọ onyeisiala Buhari ka o nye ndị agha iwu ka ha kwụsị ịgba ndị nkịtị na-eme ngagharịiwe egbe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
Ụfọdụ ndị otiegwu a ma ama n'ụwa dịka Beyonce, Rihanna, Nicki Minaj, Chance, tinyechara ọnụ katọọ gọọmentị Naịjirịa














