End Sars: E kwesịrị imechi Sars kpam kpam - Segun Awosanya
Segun Awosanya bụ ọnụ na-ekwu maka ọdịmma ọha kwuru na iwu hiwere SARS ataala nchara nke bụ na o kwesiri ịgbanwe nke taa, nke echi.
Awosanya onye a ma ama dịka "SEGAlink"sị na ọ bụghị ọrụ ndị SARS ịchụgharị ụmụnwaanyị yi akwa masiri ha maọbụ ụmụnwoke bu dada.
Na ọrụ ha bụ naanị ibuso ndị oji egbe ezu agha.
O kwukwara na iwu hiwere Sars emeghị ya ka ọ kwanyere ikike dịrị onye ugwu.
Gee ihe o kwuru n'uju: