Ehime Mbanọ attack: Ihe Ohaneze kwuru maka ọbọ ndịagha bọrọ n'ihi ndị otu e gburu na Mbano

Ụgbọala e suru ọkụ,Emmanuel Iwuanyanwu

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook

Otu Ohanaeze Ndigbo agbarụọla ihu n' ọbọ ndịagha Naijria bọrọ ndị obodo Ehime-Mbano ebe ndị ojiegbe wakporo ma gbgbuo ndịagha asatọ na nso nso a.

Otu ahụ kwuru na ha anabataghị ọbọ ndịagha nke ha na-anabata ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na-ame n"Owụwa Anyanwụ nakwa mpaghara dị iche iche na Naijiria.

N'abalị 19 nke ọnwa Septemba afọ 2023, ndị bu egbe a mabeghị ndị ha bụ wakporo ndịagha nọ n'ụgbọala abụọ agaje, gbuo ma sunye asatọ n'ime ha ọkụ.

N'iwe maka ndị otu ha e gburu, ndịagha wujuru obodo ahụ, gbuo mmadụ, mebie ọtụtụ ihe ma nwụchie ụfọdụ ndị mmadụ dịka ndị ọrụ nchekwa na-ama imi n'ala ịchọpụ ta ndị aka ha dị n'ogbugbu ndịagha.

N'ozi nke onyeisi Ohaneze bụ Emmanuel Iwuanyanwu binyere aka, gbawa ha nwere n'ihi ọgbụgbu e gburu ndịagha nakwa mbọgwara ha bọrọ ndị Ehime Mbanọ n'Imo steeti na nsonso a.

"Ọ na-agbawa m obi etu e si egbusisi ndị ọrụ nchekwa, ọ bụghị nani n'ala Igbo mana na Naijiria nile."

" Nke kachasị njọ bụ mwakpo iji bọkwara nụmụ anyị nwoke na nwaanyị aka ha dị ọcha, mebie ebe ha si akpata ego."

"Ohaneze Ndịgbo anabataghị ya."

Iwuanyanwụ, onye kwuru na Ohaneze ezigala ndị otu ha ga-aga ebe ihe ha ma imi n'ala chọpụta ndị kpara mkpamkpa ahụ ma gbochie ụdị ihe ahụ ime n'ọdịnihu.

Ndịagha na ndị uweojii ewerela ọnọdụ n’Ehime Mbano ebe e gburu ndị otu ha
Ụgbọala ndị ọrụ nchekwa a gbara ọkụ

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndịagha na ndị uweojii ejupụtala n’obodo Umualumaku dị n’Ehime Mbano Imo Steeti bụ ebe ndị ojiegbe gburu ndị otu ha n’ụbọchị Tuzde 19 Sepụtemba, 2023.

Nnyocha onye ntaakụkọ anyị mere gosiri na ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ n’obodo ahụ dịka ha na-achọ ndị ojiegbe gburu ndị otu ha.

Otu onye bi n’obodo na-achọghị ka a kpọọ ha kwuru na ọtụtụ mmadụ ahapụla obodo ahụ gbaa ọsọ maka egwu na ndị nchekwa nwere ike inwuchi ha.

“Ọdachi a etinyela ndị obodo anyị na mgbagharịa, ndị ọrụ nchekwa ejula ebe niile ma chụpụ ndị mmadụ na mpaghara ihe a mere.”

“Ndị ọkwọ ụgbọala anaghịzi agba ụzọ ugbua.”

Onyeisi ndị uweojii ụ Kayode Egbetokun katọrọ ogbugbu ndị nchekwa nye iwu ka e mee nnyocha tara ọchịchị banyere ogbugbu ndị a.

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa gara ịza oku ha natara na e nwere nsogbu n’obodo ahụ mana ha amaghị na ọ bụ ọnya ka ndị ojiegbe a shiiri ha.

Kayode gwara ndị obodo ka ha dere jụụ ma nyere ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa aka na nnyocha ha na-eme banyere nke a.

Ihe Gọvanọ Uzodimma kwuru maka ogbugbu ndị nchekwa a

Uzodimma mere njem ebe e gburu ndị ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodimma agbarụọla ihu maka ogbugbu a ndị ojiegbe gburu ndị ọrụ nchekwa ruru asatọ.

O kwuru nke dịka o mere mgbaru n’ebe ihe a mere ma sị na arụ a bụ ihe a gaghị anabata chaa chaa.

Ụgbọala ndị nchekwa a gbara ọkụ

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Gọvanọ Uzodimma kwuru na o nyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha gbakọta aka chọpụta ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ ruuru ha.

Ọ gakwara n’ihu gwa ndị obodo ka ha atụla ụjọ ọbụla ma ndị ọrụ nchekwa ọ ga-abịa ịwakpo obodo ha ma rịọ ka ha nyere ndị nchekwa aka na nyocha ha na-eme.

O tiri ndị ọrụ nchekwa na ezinaụlọ ndị a e gburu aka n’obi ma ṅụọ iyi na ọ ga-akwado na nyocha ọbụla ha na-eme.

Ndị ojiegbe egbuola ma gbaa ndị ọrụ nchekwa ruru asatọ ọkụ n’Ehime Mbano, Imo steeti

Ndị ọrụ nchekwa e gburu n'Ehime Mbano, Imo Steeti

Ebe foto si, Screenshot

Cheta na ojiegbe a wakporo ma gbuo ndị ọrụ nchekwa ruru mmadụ asatọ n’ụtụtụ Tuzde 19 Sepụtemba 2023.

Mkpamkpa a metụtara ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndịagha, ndị uweojii na ndị Civil Defence.

Ndị ọrụ nchekwa nọ n’ụgbọala abụọ mgbe na-agbafe n’ụzọ mgbe ndị ojiegbe si n’ime ọhịa gbagbuo ha ma mụnye ụgbọala ha ọkụ

Akụkọ kwuru na o nweghi otu onye n’ime nọ n’ụgbọala abụọ ahụ fọro ndụ.

Otu onye ọrụ nchekwa na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ na ezigaala ndị ọrụ nchekwa n’obodo maka ịchọpụta ndị kpara arụ a ma butala ozu ndị otu ha.

Otu nwafọ obodo a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gbara ama na oteghi aka ọ hụrụ ka ụgbọala ndị ọrụ nchekwa a gbafere, tupu awakpoo ha.

O kwuru na ọgbaghara dịzi n’obodo ugbua a maka ihe mere, na ụjọ jicha ndị obodo nke mere na ndị obodo agbachaala ọsọ.

E nwere ihe onyonyo na-egosi ka ụgbọala abụọ nke ndị nchekwa ahụ na-ere ọkụ dịka ozu ha tọgbọcha n’ala na-erekwa ọkụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Henry Okoye kwuru na nke a mere n’ezie mana kwuo na ọ ka na-achọ inwete ozu zuruoke banyere ya.

Mwakpo ndị ọrụ nchekwa a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị ọnwa abụọ ke e mee ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti.

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka ekwubuola na enweghi ezi nchekwa bụ oke ihe ịmaaka cheere ntuliaka na-abịa n'ọnwa Nọvemba 11 aka mgba.

Nke a abụghị mbụ ndị ojiegbe na-awakpo ndị ọrụ nchekwa n'ọtụtụ mpaghara Imo steeti nakwa Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

N'otu aka ahụ ndị ọrụ nchekwa anwụchiela maọbụ gbuo ọtụtụ ndị ojiegbe na-akpa ike na mpaghara ahụ.

Ndị nchekwa na-ebo otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN) ebubo ịgbu ndị nchekwa.

Ebe Ipob site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola ugboro ugboro na ọ bụghị ndị otu ha na-akpa arụ a na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ.