Etu e si chụọ ndị ojiegbe ọsọ ụkwụ erughi ala n’ọhịa Agu-Udene Akpawfu, Enugwu steeti
Gọmenti Enugwu steeti amalitela ịsụchasị ma na-ekpocha oke ọhịa Agu-Udene di n’obodo Akpawfu nke okpuruọchịchị Nkanu East n’Enugwu.
Ọhịa ahụ bụ ebe a ma ama ndị ojiegbe na ndị ekperima na-anọ atọrị nakwa egbu ndị mmadụ.
Onyeisioche okpuruọchịchị Nkanu East bụ Okechukwu Sydney Ede kwuru na ha malitere ịsụchasị ọhịa a site na ntuziaka gọvanọ Peter Mbah nyere ha.
O kwuru na atụmatụ a bụ iji chụsaa ndị ojiegbe ahụ bi n’ime ọhịa Agu Udene mere ogige ma na-akpe ike dị iche iche na gburu gburu Enugwu.
Ede kwuru na nke a so na mbọ Gọvanọ Mbah na-agba iji hụụ na e gboro nsogbu nchekwa na steeti ahụ.

Ọ gbakwụnyere na gọọmentị ga-eji ogige ebe ahụ mere ebe a ga na-akọpụta ọrụ ugbo tekịnzụ ebe ọ dị ukwuu.
Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Chris O. Nnamani kwuru na obi dị ya mma gọọmentị na-achụpụ ndị ekperima na-emekpa ha ahụ n’obodo.
BBC Igbo kpọtụụrụ ụfọdụ ndị obodo ebe ahụ ịmaka ka obi dị ha mana o nweghi onye chọrọ ikwu okwu banyere ya.
Ndị ọzọ so mee njem bụ ndị ọrụ ndịagha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.



