Nigerian Army vs ESN: Aka ESN dị ọcha n'ogbugbu ndị uweojii n'Enugu State - Emma Powerful

Ebe foto si, ESN/Facebook
Ọnụ na-ekwuru ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful ekwuola na aka otu ahụ adịghị n'ogbugbu ndị uweojii n'Enugwu steeti.
Emma Powerful kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o ziteere BBC Igbo n'abalị Satọde.
Ọ katọrọ mwakpo ndị ọrụ nchekwa wakporo ogige ndị ESN n'ụbọchị Fraịde n'obodo Akpofu dị na Nkanu, Enugwu steeti.
"Onweghị ihe ọjọọ ọbụla ESN mere ndị agha ji achụgharị ha ka e gbuo," Emma Powerful dere.
"Ndị ekperima gburu ndị uweojii ahụ gbaara ọsọ gbabaa n'ime ọhịa ebe ndị ESN nọ, mana aka ndị ESN adịghị na mwakpo ndị ọrụ nchekwa."
"Naanị ihe ESN na-eme bụ ichekwa ala ubi dị n'ala Igbo n'aka ndị ọchịehi na-egbusisi ndị be anyị."
"Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ ndị iru abụọ, ha ajụla ichekwa mpaghara ala Igbo, mana ha eburukwala ọgụ soro ndị ESN n'ọrụ nchekwa ha na-arụ,"
Emma Powerful kpọkuru Gọvanọ Enugwu steetị bụ Ifeanyi Ugwuanyi ka o mee ka ndị uweojii na ndị agha nọ na steeti ahụ mata na aka ndị ESN adịghị n'ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ.
Gọọmentị Enugu steeti etiela ezinụlọ ndị uweojii e gburu egbu aka n'obi

Ebe foto si, Louis Amoke
N'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ naabụọ nke Julaị ka Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi gara leta ezinụlọ ndị uweojii ahụ tufuru ndụ ha na mpaghara Obeagu-Amechi nakwa n'Amagunze.
Aha ndị uweojii a lara mmụọ bụ Timothy Tion, onye Benue Steeti, na Emeka Christian Nnaji onye Owo nke dị na Nkanu East.
Cheta na ndị ekperima amaghị ndị ha bu gbagburu ndị uweojii a ebe ha nọ n'ọrụ nchekwa ha n'ụbọchị Wenezde.
Gọvanọ Ugwuanyi kwere nkwa inye ndị nwunye ndị uweojii ahụ lara mmụọ ọrụ na gọọmentị steeti, ma kwụkwaa ha ha ụgwọ ọnwa atọ nke di ha kwesịrị ịnata.
Etu ndịagha Naịjirịa si wakpoo obodo Akpawfu, Amagunze na Akpugo

Akụkọ pụtara n'abalị a bụ na a na-agba egbe aghara aghara n'obodo Akpawfu, Amagunze na Akpugo dị n'Enugwu Steetị.
A sị na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa gụnyere ndịagha na ndị ọzọ gbakọtara aka ọnụ wakpoo ogige e chere na ọ bụ nke ndị Eastern Security Network dị n'obodo ndị a.
Nke a mere ụda egbe ji ada ebe niile mana o dobeghi anya mmadụ ole merụrụ ahụ maọbụ ndị e gburu.
Otu onye bi n'onodo ebe ahụ gwara BBC Igbo na ha ji ọsọ gbapụ n'ụlọ ha ma tinye isi n'ọhịa maka izerendụ ha.

Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe, ọ zaghị ekwe ntị ya tupu akụkọ a apụta.
Cheta na izuụka olemole gara aga ka ndịagha wuchikwara n'obodo Akpawfu ka ha na-achọ ụfọdụ ndị otu Ipob.

Mana mwakpo nke ugbua na-abịa dịka ndị oji egbe gbuchara ndị uweojii anọ na na ndị nkịtị abụọ n'obodo Obeagu Awkunanaw n'ụbọchị Wenesde.










