Aka Ipob adịghị na-ibepụ nwoke amụ n'Imo Steeti, mana osu imi nwere ezigbote nsogbu - Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful ekwuola sị, "enweghị ihe anyị ma maka ihe onyonyo gosiri nwoke ebepụrụ amụ na-ewu na soshal midịa".
Okwu a na-abịa dịka ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke gosiri ọtụ nwoke nọ n'agbụ.
O yiri ka ebepụrụ nwoke ahụ amụ dịka e boro ya ebubo na ọ bụ onye osu ime.
Emma Powerful gwara BBC Igbo na agbanyeghị na ndi otu ya amaghị maka ihe mere nwoke ahụ "onye ọbụla na-agba mgba ogburu igbochi nchọta Biafra, ma ọ bụ nwoke maọbụ nwaanyị, ma ọ bụ onye na-arụ na gọọmentị ma onye anaghị arụ na gọọmentị nwere nsogbu".
N'ihe onyonyo ahụ ndị ji nwoke ahụ kwuru na aha ya bụ "Matador" ma sịkwa na a na-etukwa ya "Enyi ọha nke Ursu".
Olu na-ekwu ya bụ ihe onyonyo sị na nwoke ahụ ha jidere bụ onye Orsu ma boo ya ebubo na ọ na-arụrụ gọọmentị Hope Uzodinma ọrụ.
Ha kwukwara na ọ bụbu onye enyemaka pụrụiche onye omeiwu steeti.
Ndị nọ na ya bụ ihe onyonyo kwuru na ha jidere ya maka na ọ na-agba ndị obodo ya mgba okpuru.
Ha kwuru na nwoke a naara ego, keesa ndị mmadụ ma sị ha kwuo na enweghị ụgbọelu tụrụ ogbunigwe na Imo Steeti.
Na soshal midia, ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị Ipob na ESN kpara ike a maka ụdịrị ebubo e boro nwoke ahụ.
Mana, Emma Powerful sara nke ahụ were sị na enweghị ihe anaghi ebo ndị ESN.
Ọ sị: "maọbụ anyị ma ọ bụghị anyị a ga-asị na ọ bụ anyị. Ọ bụ ya mere anyi anaghị eji ike aza ụdịrị ihe ndị a".
Ihe ndị uweojii kwụrụ
Ndị uweojii Imo state ekwuola na ha ahụla ya bụ ihe onyonyo ha sị jọgburu udele ma sigbuo nkapi nke gosiri ebe ekegidere otu nwoke n'osisi ma na-ata ya ahụhụ.
Ha kwuru na ha ebidola nyocha pụrụiche maka ya bụ ihe onyonyo ahụ ka ha mata ebe ya bụ ihe mere ma ọ bụ n'Imo Steeti ka ọ bụ ebe ọzọ.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi ha depụtara n'ụbọchị Sụnde ka ha kwuru nke a ma sịkwa na ha ga-agwa ndị ọha ihe ha chọpụtara.
Ha gwakwara ndị Imo steeti ka ha hapụ ịtụ ụjọ.












