Ipob na ESN: 'Ihe m ji hiri isi bụ Chukwu okike Abiama' - Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images/Screengrab
Emma Powerful ekwuola na Ipob anaghị agwọ ọgwụ, o kwuru na onye ndu otu ha bụ Nnamdi Kanu bụ onye gwakwara ha maka Chukwuokikeabiama bụ chukwu bi n'eluigwe.
O kwuru na ndị uweojii mụtaziri ha gbuo ndị mmadụ ha boo ya na onye ahụ bụ onye Eastern Security Network maọbụ Indigenous People of Biafra "mana ọ bụghị eziokwu" dịka Powerful si kwu.
N'onụ ya, "ndị uweojii na-eme ihe sọrọ ha mana ihe kacha anyị mkpa bụ anyị ga-enwetarịrị Biafra ọsọkwa ya ndị uweojii gbuwe ndị mmadụ etu o si masị ha"
"Anyị enweghị dibia, ihe anyị nwere bụ chukwu bi n'eluigwe."
"Nnamdi Kanu mere ka anyị mata na ihụ mmadụ, ịkpọọ ya nwa chineke." Nke a pụtara na dibia kacha dibia bụ chineke."
"Hope Uzodimma chọọ ya gbukpoo ndị nille nọ n'Imo steeti, Biafra n'ala, mgbe anyị lara, anyị ga-esiri Uzodimma nri a o na-esiri anyị ugbua."
Etu Ipob/ ESN si gbu dibia na-agwọrọ ha ọgwụ maka ... uweojii Imo steeti
Ndị uweojii nọ n'Imo steeti ekwuola na ndị otu Indigenous people of Biafra nakwa Eastern Security Network etịkọla aka gbagbuo dibia na-agwọrọ ha ọgwụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti ugbua bụ Csp Michael Abattam depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zịgara ndị ntaakụkọ.
O depụtara aha dibia ahụ dịka Paschal Okeke si Umudim Ukwu Orji Awomama n'okpuruọchịchị Oru East nke Imo State.
Etu ya bụ ihe si mee
Abattam kwuru na ndị Ipob/ESN bu ụzọ gbagbuo nwa dibia anya nzu ahụ, berie ya, bepu ya isi ma gbaa ahụ ya na bee ya ọkụ "makana ọgwụ ọ na-agwọrọ ha anaghị adị ire ichekwa ha n'aka ndị uweojii."
"Ha nyere nwa dịbia nzu ezigbo ego makana o kwere ha nkwa na ọ ga-echekwa ha ka mgbọ ndị uweojii ghara ịbanyenwu ahụ ha."
Kọmịshọna uweojii n'Imo steeti bụ Abutu Yaro gwara ndị otu Ipob na ESN ha gbara ọgwụ ha nwụọ site n'ịnabata udo nakwa nhaziagharị, ọ bụghị ya, ha nwere ihe ọbụla ha hụrụ.
Ọ gwara ndị Imo ha atụla egwu makana udo achịwala na steeti ahụ ugbua.
BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ Ipob gbasara akụkọ a.










