Sunday Igboho sị na ihe dị egwu ga-eme ma ọkọ kọọ Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Sunday Igboho/Facebook
Sunday Adeyemo bụ onye e ji Sunday Igboho maara adọọla ndị ọrụ nchekwa aka na ntị ka ha hapụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor bụ onye ha wakporọ ụlọ ya n'Anambra Steetị na nso nso a.
Adeyemo sị na site ugbua gawa na ihe dị egwu ga-eme ma ọ bụrụ na ọkọ kọọ Ejiofor, na onye ọbụla aka ya dị na mwakpo ahụ ga-ata ahụhụ ya.
N'akwụkwọ ozi nke Adeyemi wepụtara nke ọnụ na-ekwuru otu Yoruba Nation bụ Oloyemi Koiki wepụtara ụbọchị Wenezde (16/6/2021), binyere aka, ọ kọwara na Ejiofor abụghị naanị ọkaiwu Nnamdi Kanu kama na ọ bụ ọkaiwu Sunday Igbogho nakwa nke Femi Fani-Kayode.
o kwuru na nke bụ ugboro abụọ ndị ọrụ nchekwa ga-awakpo ụlọ Ifeanyi Ejiofor, na e gburu onye enyemaka ya ma kpọọ ozu ya ọkụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Ọ sị na kEmgbe nke a mere na ndị ọrụ nchekwa ewepụtabeghi ozi ọbụla ịkọwa ihe mere ha ji wakpoo ụlọ Ejiofor.
Igbogho kpọrọ oku sị ka ndị ọrụ nchekwa tọhapụ ndị niile na-arụ ọrụ n'ụlọ Ejiofor ha nwuchiri na-egbughi oge ọbụla.
Cheta na akụkọ kwuru na ndị e che na ha bụ ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdị Kanụ n'ụbọchi 6 nke ọnwa Juun.
Etu a sị ndị ọrụ nchekwa ji wakpoo ụlọ Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/BBC/ Getty Images
Ndị Oraifite ekwuola etu ndị ha na-eche na ha bụ ndị agha Naịjirịa nakwa ndị uweojii si wakpoo ụlọ onye bụbụ ọkaiwu onye ndu Indigenous People of Biafra, Nnamdi Kanu n'Oraifite dị n'okpuruọchịchị Ekwusigo, Anambra steeti.
Onye bi n'akụkụ bee Ifeanyi Ejiofor n'Oraifite kwuru na ndị ahụ e chere bụ ọrụ nchekwa Naịjirịa wakporo ụlọ Ejiofor n'abalị Satọde ma gbagbuo otu onye ọrụ nchekwa ya ma buru ozu ya.
O kwuru na ọ nụkwara na e kpokọrọ ndị ọrụ nchekwa atọ ndị ọzọ na-eche bee Ejiofor mana agbaghị ụlọ ya ọkụ.
Ifeanyị Ejiofor depụtara ozi n'akara Facebook ya banyere mwakpo ahụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ihe ọzọ mere n'Orafite
Onye ọzọ bikwa n'Orafite kwukwara na ụnyahụ na ya nụrụ na ndị obodo Akwa Ukwu dịketere Oraifite gbara ọsọ.
Ndị 'unknown gunmen" wakporo ụgbọala ndị ugwu bu ehi abata Akwaukwu dị n'okpuruọchịchị , gbagbuo ndị ugwu abụọ nọ n'ụgbọala ahụ ma chụsasia ehi ndị ahụ ha bu.
Nke a mere ka ndị obodo ahụ jiri ụjọ gbapụ ọsọ maka ụjọ na ndị ugwu nwerike ịbakute ha bọgwara ogbugbu ụmụnne ha.
Mana mmadụ abụọ a gwara BBC okwu kwuru na Oraifite ederela duu ugbua mana ndị ọrụ nchekwa ka nọcha n'Akwaukwu maka ụjọ ji ndị obodo ahụ.
Mbọ BBC gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ n'Anambra gbasara mwakpo ndị a mere n'Oraifite nakwa Akwa Ukwu amitabeghị mkpụrụ dịka ndị Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuchitere ha ebubeghị ekwenti ya.
Ụda egbe ekweghi anyị rahụ ụra n'abalị - ndị bi n'Ọjịị Imo steeti

N'abalị Moọnde ka ndị bi n'Ọjịị gwara BBC na ha enweghị ike ihi ụra n'ihi ụda egbe.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Owerri kwuru na Owerri emepewela obere obere, na-agbaenyighi na azụmahịa ebidochabeghi nke ọma.
Kemgbe ndị omekome gbara egbe n'ụzọ Ọjịị dị n'Owerri n'ụbọchị Mọnde, ndị ahịa, ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ jị ọsọ gbaba n'ime ụlọ ha. O kwukwara na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị sị na chụrụ ndị omekaome ahụ ọsọ n'oge ha bịara mwakpo ahụ.
Ọ sị na kọmishọna uweojii Imo Steeti bụ Abutu Yaro ezitela ozị sị na ndị uweojii jupụtara n'akụkụ steetị ahụ niile na nchekwa.
Gịnị mere n'Umuahia?

Akụkọ onye hụrụ ihe merenụ na-ekwu na gọọmenti Abia steeti gbachịrị ahia ndị osisi dị n'okporoụzọ Ikot Ekpene,Umuahia n'ụtụtụ taa (June 7, 2021) maka akwụghị ụgwọ ụtụisi.
Nke a mere ka ndị na-ere ahịa nọrọcha n'iro mana ndị ọrụ Bakassi nọ n'ime ụlọọrụ n'ime ahịa ahụ.
Ndị chọrọ ịrụ ọrụ ngo n'ime ahịa ahụ nakwa ndị ọrụ Bakassi bidoro nwewe nsogbu nke mere ka otu onye ọrụ Bakassi gbara mmadụ abụọ ndị oru ngo ahụ egbe mana o nweghi onye nwụrụnụ.
Nke a mere ka ndị ahịa chụwa ndị Bakassi ahụ ọsọ ma mụnye ụgbọala nakwa ụlọọrụ ha ọkụ.
Ọgbaghara a chụsasiri ndị ahịa Timber niile ugbua.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara mkpamkpa a.
Etu 'unknown gunmen' si gbaa ụlọ kọmishọna mgbasaozi Imo steeti ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala ụlọ kọmishọna mgbasaozi n'Imo Steetị bụ Declan Emelumba ọkụ.
Emelumba sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ ahụ gbara ụlọ ya dị na n'obodo Ubulu-Ihejiofor nke okpuruọchịchị Oru West, n'ụbọchị ụka Juun 6, 2021.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ BBC n'ewkentị na ndị ahụ gbara be ya ọkụ ma repịa ihe niile dị n'ime ya kpam kpam.
O kwughi kwa ma a gbara ụlọ ndị dị be ya nso ọkụ dịka ndị ntaakụkọ na-ekwu mgbe ahụ.
Emelumba kwuru na mgbe ndị omekome ahụ wakpochara ụlọ Okoliogwo, ha buru ụgbọala gọọmenti a dọsara n'ụlọ ya.
O kwuru na ya bụ ụgbọala so n'ihe ndị uweojii napụtara ndị omekome ahụ mgbe ha gara ịwakpo isi ụlọọrụ dị n'Owerri, nke ndị uweojii kwuru na ha kwụsịrị n'ụbọchị ụka, Juun 6, 2021.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ya bụ mwakpo mere na be kọmishọna.
Ndị uweojii kọwara mkpa mkpa kpara n'Imo steeti n'ụbọchị June 6, 2021
Ndị uweoji nọ n'Imo steeti kwụsịrị ndị "unknown gunmen" biara ịwakpo isi ụlọọrụ ha dị n'Owerri ma gbuo otu Joseph Uka Nnachi akpọrọ " King of Dragons" na bekee bụ onye e kwuru na-awakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti.
Ha gbukwara ndị oji egbe anọ ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Bala Elkana kwuru na ndị omekome ahụ ruru iri wuchiri ebe elekere isi nke ụtụtụ(6:15am) ji ụgbọala "Hummer" si Works Layout dịketere ụlọakwụkwọ Alvan Nursery na Pramarị mana mgbe ahụ ka ha na ha bidoro kwatawa mgbọ.
Elkana na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ebe o kwuru na ha zọpụtara otu nwaanyị onye uweojii ndị omekome a nwụchiri ma mebie ogige ebe ha bi.
Elkana kwuru na ndị uweojii nwụchịrị otu onye n'ime ha aha ya bụ Stanley Osinachi dị afọ iri atọ ma bụrukwa onye Achi /Mberi, n'okpuruọchịchị Mbaitoli.
Osinachi kwetere n'onyonyo na-efegharịnụ na ọ bụ onye otu Easter Security Network nakwa Dragon bụkwa onyesisi otu ESN nọ n'Imo steeti na-eso Nnamdi Kanu.
Elkana kwuru na otu onye uweojii merụrụ ahụ mgbe ha na ndị omekome ahụ na-akwata mgbọ ma na-anata ọgwụgwọ n'ulọọgwụ.
O kwuru na ha napụtara ndị omekome ahụ, AK-47 anọ nakwa mgbọ egbe ruru puku abụọ nakwa ọtụtụ ogbunigwe.
Ọ makwara ọkwa sị, "Anyị na-enye ndị niile zuru egbe ndị uweoji ruo ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ka ha weghachi ya, makana ọ ga-adị onye ahụ njọ ma anyị bido nzacha anyị mgbe ụbọchị ahụ gachara".
Elkana kọwara na ọgwụ 'Ode eshi' ndị a ha gburu yi n'ahụ ha azọpụtaghị ha.
O kwuru sị, "Anyị chọrọ ka ụlọ oriri na ọṅụṅụ niile nọ n'Owere bido rụwa ọrụ dịka ha si arụ na mbụ, ka Owere lọghachịkwa dịka obodo aṅụrị eji mara ya".
Cheta na n'abalị satọde fotere Sọnde Juun 6, 2021 ka onyonyo a sị na-egosi ụda egbe na-ada n'elu nakwa n'ala n'Owere malitere fegharịwa.
Ọtụtụ mmadụ bidoro kwuwe na ha arahụghị ụra maka ọgbaghara ahụ.
Mkpa mkpa a na-abịa dịka ụkọchukwu Archbishop nke Owere bụ Anthony J.V Obinna depụtara akwụkwọ ozi degara Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma maka ọgbaaghara nọ n'Imo steeti.
Obinna kwuru na ọ gwara Uzodimma na ndị ọchịchị Igbo ndị ọzọ n'afọ gara aga ka ha chekwaa ndị mmadụ nakwa ala Igbo niile gburugburu.
O kwuru na ọ bụ maka mwakpo ndị ọchiehi mere o jiri gwa ha ya bụ okwu oge ahụ.










