Evelyn Joshua: Ihe i kwesịrị ịma maka nwunye T.B Joshua bụzi onyeisi ụlọụka SCOAN

Ebe foto si, TB Joshua/EvelynBalogunJoshua/Instagram
Evelyn Joshua nwunye T.B Joshua abụrụla onyeisi ụlọụka 'Synagogue Church of All Nations (SCOAN).
Ọ bụ n'ozi ha zipụrụ n'akara Facebook ha ka ụlọụka SCOAN kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde a.
Oteela aka ndị mmadụ ji ajụ onye ga-abụzị onye ndu ya bụ ụlọụka dịka onyeisi ya bụ T.B Joshua lara mmụọ n'abalị isii nke ọna June afọ a.
N'akwụkwọ ozi ahụ, ha kwuru sị: "Anyị na-ekele onye ọbụla maka ekpere ụnụ na ịhụnanya ụnụ na-egosi ụlọụka a kamgbe nna anyị lachara mmụọ."
"Ugbua bụ oge Chineke kwadoro ka anyị na-agakwa n'ihu dịka Odoziakụ Evelyn Joshua ga-eduru anyị na-aga."
Anyị na-arịọ ekpere na nkwado ụnụ niile ka Chineke nye ya amamihe ọ ga-eji rụọ ọrụ a nke ọma."
Ihe i kwesịrị ịma maka Evelyn Joshua

Ebe foto si, evelynbalogunjoshua/Instagram
Tupu Onye Amụma T.B Joshua alaa mmụọ, nwunye ya bụ Evelyn abụghị onye ọtụtụ mmadụ ma.
Ọ naghị apụtakarị n'ọha maọbụ na mmemme, kama ọ na-anọrọ onwe ya.
Mana Evelyn bụkwa ụkọchukwu na ụlọụka SCOAN. Ọ na-ekwu okwuchukwu na ya bụ ụlọụka oge ụfọdụ.
Evelyn na di ya matara onwe ha n'afọ 1990.
N'emume akwamozu T.B Joshua, Evelyn kwuru na ha anọkọọla ọnụ ruo afọ iri atọ na otu (31 years).
Evelyn mụtaara T.B Joshua ụmụ atọ: Serah, Promise, na Heart.
Ebe na mgbe a ga-eli ụkọchukwu TB Joshua

Ebe foto si, Tb Joshua
Ụlọụka Synagogue Church Of All Nations ekwuputela ebe na mgbe a ga-eli ụkọchukwu ha bụ Temitope Balogun Joshua.
N'akwụkwọ ozi ha weputara n'ụbọchị Mọnde, ha kwuru na a ga-eli ụkọchukwu Joshua n'isi ụlọụka SCOAN dị na Legọs.
"Anyị na-akwado mmemme olili ya nke ga-eru otu izuụka malite n'ụbọchị Julaị 5 (Mọnde) ruo Julaị 11(Sọnde) maka ikwanyere TB Joshua ugwu ikpeazụ".
Nke a na-abịa dịka nwunye Tb Joshua bụ Evelyn kwuchara na a ga-eme ka ọha mara etu e si akwado olili TB Joshua mgbe gọọmenti Legọs bịara ya mgbaru n'izuụka gara aga.
Cheta na onyeisi obodo TB Joshua dị n'Ondo steeti kwuru na ọ chọrọ ka elie Joshua n'obodo ya.
Ụlọụka SCOAN kwuru na ụwa nwerike ikiri ụka akwamozu TB Joshua n'onyonyo ha bụ Emmanuel TV
Etu ụkọchukwu Temitope Balogun Joshua si laa mụọ

Ebe foto si, Getty Images
Temitope Balogun Joshua bụ ụkọchukwu chọtara Synagogue Church of All Nations (SCOAN) anwụọla.
Ụwa niile nọ na mgbagoju anya ugbua maka etu o si nwụ.
Ndị ụlọụka ya biara ụka n'ụtụtụ taa bụ June 6,2021 ji anya mmiri na-agagharị ebe ahụ.

Ụfọdụ na-ekwukwa na a gbachiri ụlọụka Synagogue kamgbe oge 'lọckdown' maka igbochi mfesa coronavirus.
Etu ụlọụka Synagogue si depụta maka ọnwụ TB Joshua n'akara Facebook ha

Ebe foto si, Tb Joshua ministries
Dịka ụlọụka Synagogue si depụta, n'ụbọchị Satụrday 5th June, onye amụma TB Joshua kwuru okwu n'ọgbakọ 'Emmanuel TV Partners Meeting.'
" E nwere oge ihe niile- oge ị bịa nara ekpere ebe a nakwa oge ịlaghachị bee gị ma akacha ụka."
"Chukwu akpọrọla oru ya nwoke bụ onye amụma TB Joshua dịka o si masị ya."
Ọ nọ na-eje ozi n'ụlọụka chukwu. Nke a bụ ihe e ji mụụ ya, ihe o biri ndụ ya maka nakwa ihe o ji nwụ, dịka ụlọụka ya si depụta.
Ha kwukwara na okwu ikpeazụ ya bụ "gbado anya, kpe ekpere."
Ihe ndị ikwesiri ịma maka TB Joshua nwụrụ n'afọ 57

Ebe foto si, TB Joshua ministries facebook page
Onye amụma T.B. Joshua bụ ụkọchukwu Naịjirịa nakwa nke onye ọbụla na-ahụ n'onyonyo mabụrụkwa onye na-enyekarị ndị mmadụ ihe.
Ọ bụ ya chọtara ụlọụka "The Synagogue, Church of All Nations (SCOAN)" nke na-egosi n'onyonyo akpọrọ Emmanuel TV na bekee.
A mụrụ ya na June 12, 1963. Dịka websait Synagogue si depụta, church of Nations, Joshua nọ n'afọ nne ruo ọnwa iri na ise(15 months) tupu a mụọ ya.
Ọ gara ụọakwụkwọ St. Stephen's Anglican Primary School (Ikare-Akoko, Nigeria, 1971-1977), mana ọ gụchaghị otu afọ n'ụlọakwụkwọ Sekọndiri.
N'ụlọakwụkwọ, a ma ya dịka obere ụkọchukwu maka etu o si hụụ bible n'anya nakwa ihe chineke nakwa ikike o nwere ikwu ihe ga-eme n'ihu gbasara ogbe ya, dịka websait SCOAN si depụta.
Ọ bụ onyeisi Scripture Union mgbe ọ nọ n'ụlọakwụkwọ.
Ama ya ama n'Afịrịka niile nakwa Latin Amerịka.
N'afọ 2011, Forbes depụtara Temitope Joshua bụ ụkọchukwu atọ na Naịjirịa ego ya ruru $10 million - $15 million.
Etu ndị mmadụ si gosi nwute ha maka ọnwụ TB Joshua
Ndị ụlọụka SCOAN tọgbọcha n'ala iji gosi na obi adịghị ha mma.

Ndị na-akwa akwa

Gwamnishu Harrison e jikwa inyere ndị ọnenweghị ka ọ ha ha gosiri nwute ya maka ọnwụ TB Joshua,

Ebe foto si, Facebook
Charles Awuzie bụkwa onye ji egeo achụ ego ama ama gosiri nwute ya maka ọnwụ TB Joshua.

Ebe foto si, Facebook










