Prophet Odumeje: Gịnị na-esere ya na ụmụ Pericoma na ndị Arondizuogu?

Ebe foto si, Fenfe Pericoma/Odumeje
Aha onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere e ji 'Odumeje' mara ka na-ewu n'elu ịntanetị maka okwu dị n'etiti ya na ụfọdụ ndị Arọndizuọgụ.
Ihe butere okwu a bụ ihe onyonyo fesara ebe Odumeje kparịrị otiegwu a ma ama bụ Pericoma Okoye na ụmụ ya, na ndị Arọndizuọgụ dịka o kwuru na ha enweghi ike nke ha ji baa uru.
Odumeje kwuru na ọ gwara Pericoma bịa ka ha nwaa ike ka ike oge ọ dị ndụ, mana ọ bịaghị.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị Arọndịizuọgụ enweghị ọgaranya a na-anụ aha ya, na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Okwu a were Fenfe na Omor Perry bụ ụmụ Pericoma na ndị obodo ha dị n'Imo steeti iwe, mere na ha na ndị dibia ọzọ si n'obodo ahụ buru ya n'isi ma sị na ha na Odumeje ga-achịpụrịrị ya.
Ha boro Odumeje ebubo na o si na mba India nata ike ya, na ọ bụghị Chineke kpọrọ ya oku ọ na-aza.
Ma kwuo na ha ga-agbapu ya afọ ma gosi ya ihe ọkụ ji ntị oke eme ma ọ bụrụ na ọ pụtaghị rịọ mgbaghara n'ime abalị asaa.
Omor Perry kwuru sị na ọ ga-aka mma na Odumeje ga-ekwe ha bịa n'ụlọụka ya bịa gosi ya nke tọrọ fada, ka ọ ghara ịbụ na ha kpọ ya gaa ebe ike ha ka.
Lee ihe nkiri gosiri ebe Omor Perry mara Odumeje aka:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nwanne ya nwoke a ma dịka Fenfe Pericoma makwara Odumeje aka n'ihu nke ya, sị ya na ha kwadooro ya akwado, chebiri ya echebiri:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Anyị gbalịrị inweta Omor Perry n'ekwentị, o kwuru na ọ ga-azaghachị anyị mgbe o nwere ohere n'oge na-adịghị anya.
Akụkọ ga-amasị gị:










