Sunday Igboho: Ihe ndị Yoroba na-ekwu maka atumatụ nwereonwe

Sunday Idogho

Ebe foto si, Sunday Idogho

Sunday Adeyemo ejikwanu Sunday Igboho mara ekwuola na o nweghikwa okwu dị na ịga n'ihu na otu Naịjirịa ebe udo kọrọ ka ọkọchị n'ala Yoroba, gbanye na otu ogbugbo ha nwere bụ inweta obodo Yoroba kwụrụ onwe ya.

Igboho kpuhere nke a n'ụbọchi Wednesday mgbe o nwere mkparịtaụka n'etiti ndị ntakụkọ, kpọkuru ndị ntoroọbia ala Yoroba nille ikwado ọkammụta Banji Akintinye n'atụmatụ ya inweta obodo yoruba kwụrụ onwe ya n'ọnọdụ mba Oduduwa.

N'okwu ya,''Oke ruoro anyị ka anyị na-achọ, ndị ntorobia Yoroba niile nọ n'ala a, ga-adọnyeriri Baba Akintonye ukwu.''

Ọ sịkwa; "Mụọ onwe m bụ Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara ga akwado nna anyị, nkea bụ onye doro anyị anya na achọ maka oke ruoro anyị. Anyi na arịọ amara chineke maka ogologo ndụ na arụ isiike n'isi ya. Enweghi udo, nchekwa adighịkwa.''

Anyị achọghi ndi Fulani na-achị ehi

Adeyemo sị: "Bido taa gawa anyị achọghị ndị Fulani na-achị ehi n'ala anyị ila akụkụ ubi anyị n'iyi, anyị echere ha aka mgba ma laa ha niyi.

''Ọ bụrụ na ndị uweoji wakpoo anyị n'ihi ya, anyị ekeelere ha nkwụcha, kpụọ isi chere mkpọrọ, anyị achọkwaghị Nigeria ọzọ, kama mba yoruba . onweghi ihe di na otu nigeria ebe imirikitimi akụrụngwa eji enyere ndụ aka na ala nigeria nọcha na aka ndi mpagara ugwu''.

Sunday Igboho

Kedụ etu ndị Yoroba si nabata atụmatụ a?

Ụfọdụ ụmụ amala Yoroba e tinyela ọnụ n'okwu a n'eko achịcha maka ọkpụkpọ oku Sunday Idogho na akpọ ka enye yoruba mba nke aka ya;

Dọkịnta Yemi Farounbi - bụ a na-akwanyere ugwu n'ala Yoroba ma bụrụ kwa onye nọchiteburu anya ala Nigeria na mba Phillipines - n'itinye ọnụ na ya bụ okwu, kpuhere na ọ bụ eziokwu na ụmụ ala Yoroba na-akwa arịrị maka enweghi ezinchekwa.

Ọ sị; ''ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ndị kwesiri ichekwa ha gbakụtara ha azụ.''

O rutukwuruaka na agbanyeghi na otu jikọrọ ụmụaamala yoruba Afanifere na-eti mkpu ka ahazigharia ala Nigeria, ihe ndị a niile kwesiri ka elebe ya anya.

Ọ gara n'ihu kwuo na nnwere onwe Sunday Idogho na akpọ ọkpụkpọoku ya kwesiri ịbụ nkwado ụmụanala Yoroba na abụghi nke otu onye.

Bar Stephen Ajibola James n'itinye ya ọnụ site na ngalaba ikpe, katọrọ agwa Sunday Idogho na ndi ọzọ dika Nnamdi Kanu na Asari Dokubo na-azọ ka enweha mba nke aka haa.

Ọ hụtara ya dika nke dara iwu n'ihi na okwesiri inwe nkwado ndị omeiwu bụ ndị okwuru ga-esoro ụkpurụ ime ka obodo bụrụ mba kwụrụ onwe ya.

Ọzọkwa o kwuru bụ Gbanye na inye mba ikekiere bụ ihe iwu kwadoro kama na ekwesiri isoro ụkpụrụ dị ma.

Gbasara ihe gọọmenti n'onwe ya kwesiri ime na ọkpụkpo oku inwe mba Yoroba kwụrụ onwe ya, Ajibola kwuru na ọnaghi akwado ka gọọmenti nwuchie ọbụla maka ihe iko obi n'elu kama leghara ya anya nihi na ya bụ okwu achịtaghị aja ọbụla.

Cheta na dika Sunday Adeyemo na-ekwu okwu Oduduwa maobu Yoroba Republic, NNamdi Kanu, Asari Dokubo, Ralph Uwazurike na ọtụtu ndị ọzọ na-achọkwa atụmatu nwere onwe nke ha.

Mana, agbanyeghi ihe ha na-eme, iwu Naịjiria akwadoghi nkewa mba ahụ.