Father Ejike Mbaka on DSS: Ha na-akpọ m n'Abuja maka ihe ndị m kwuru

Ebe foto si, Facebook/AMEN
Rev Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik hibere Adoration Ministry, ekwuputela etu ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) si kpọkuo ya.
Fada Mbaka kwuru na ndị DSS kpọkuru ya ka ha gbaa ya ajụjụ gbasara okwu ndị o kwuru n'ụbọchị Tọzde, mana ndị nchekwa ya gwara ha ka ha laa ma bịaghachị bịa nye ya akwụkwọ ozi ahụ etu o kwesịrị.
Fada Mbaka kwuru nke a dịka ọ na-edo ihe bụ maasị nke mbụ ya kemgbe Katọlik Dayọsis Enugwu buliri mmachi ha machiri ya.
BBC Igbo na-agba mbọ inweta ndị DSS ka ha kwuo okwu, mana ha ebubeghi ekwentị ha.
Ka ọ na-aka ya bụ ụka, Fada Mbaka kwuru sị "Asị m mechie ọnụ ka m kwubezie na obodo dị mma, obodo adịghị mma. N'ike ndị amụma, Chineke ga-agbara obodo a ọgụ."
Fada Mbaka dọrọ ndị ọ sị na-anwa ịkwụsị ndị mmadụ ịka ụka n'ọgbọ Adoration aka na ntị na ha "ga-ata ikikere eze".
O kwuru na ọ bụghị taa ka o kwuwere okwu banyere ọchịchị; o kwuru etu o si kwupute okwu oge ọchịchị Sani Abacha, etu o si gwa Ibrahim Babangida na Olusegun Obasanjo ihe ndị na-adabaghị n'ọchịchị ha n'ihu na ihu, nakwa Musa Yar'adua oge ọchịchị ha niile dịka onyeisiala.
O kwuru na ọ naghị eme ihe ndị a ka ọ data ego, na ọ bụ ịzọpụta ndị mmadụ ma nye Chukwu otito.
Ọ gara n'ihu kwuo sị "ọ bụrụ gịnwa ka e dunyere ka ị bịa gbọchie Fada Mbaka ọnụ, ọ bụ ozi iberibe ka e dunyere gị n'ihi na ị gaghị arụnwu ọrụ ahụ.
Maka na ọ bụghị gị kpọrọ m oku, ọ bụghị gị ziri m ọrụ. Ndị na-eche na Mbaka ga-emechi ọnụ na-egbu oge ha.
Anaghị m akpa oke ndọrọndọrọ ọchịchị nke m ji akpa oke agbụrụ, ọ bụ ụmụ mmadụ ka m na-anọchiteanya ya."
"Ị na-achụ onye nwụrụ anwụ. Ị ma mgbe m nwụrụ? Anwụrụ m n'ụbọchị 29 nke Julaị 1995"
Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Fada Mbaka kwuru n'ụka ahụ ọ kara n'ụbọchị isii nke ọnwa Juun 2021.
- Fada Mbaka kwuru ka ndị mmadụ hie asaa n'anya maka Adoration Ministry a, n'ihi na onye ọbụla kwugidere maọbụ megide ya nwereike ịhụ iwe eluigwe n'ihi na ọ bụ nwa Mmụọ nsọ hụrụ n'anya.
Akụkọ ka na-abịa









