Fr Ejike Mbaka: Ụka Katọlịk anapụla Fada Ejike Mbaka ikike ịbụ oji-ji-jide-mma Adoration ministry'

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu
Ụka Katọlịk na Dayosis Enugwu anapụla Fada Ejike Mbaka 'Adoration Ministry' o hibere tinye ya n'okpuru dayọsis.
A machikwara ya itinye ọnụ n'okwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Nke a na-abịa ka ọ nọchara nkwụsị ọrụ nke Bishop dayosis ahụ bụ Calistus Onaga kwụsiburu ya abalị 30 maka mee 'ekpere" ọpịpịa nakwa ntụgharịuche'.
N'ozi nke nnukwu ụkọchukwu na-elekọta dayọsis ahụ bụ Bishọpụ Calistus Onaga zigara Mbaka, n'abalị atọ nke ọnwa Juun, ọ sịrị, "Adoration Ministry Enugu ga-abụzị 'Chaplaincy' nke ga-anọ n'okpuru Dayọsịs Enugwu nke Fada Mbaka ga-abụ onye ndu ya."
Dịka ọnụ na-ekwuru dayosis ahụ bụ Fada Benjamin Achi siri kọwaa, "A ga-ebidokwa kuziwe nkuzi katikizim dịka ndị Katọlik na-akụzị."
"Ọ gaghị anọzi dịka ministri dịka ọ dị na-mbụ, a ga-enwezi ihe a kpọrọ "chaplaincy council bụ ndị isi ga na-ahazi ihe a na-eme."
"Onye ọbụla na abụghị Katolik agaghị enwe ọkwa pụtara ihe na chaplaincy."

Ebe foto si, Enugu Catholic Diocese
Fada Achi kọwara na Fada Mbaka ka ga-abụ 'Chaplain' nke 'chaplaincy' ahụ mana a ga-etinyere ya ndị ụkọchukwu ndị ọzọ ya na ya ga na-arụkọ ọrụ.

Ebe foto si, Enugu Catholic Diocese










