Father Ejike Mbaka: Ihe ndị ị maghị maka ndụ ụkọchukwu a na-ewu ewu

Aha onyonyo, Father Ejike Mbaka na ihe ndị ị maghị maka ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Fada Ejike Mbaka.

Fada Mbaka bụ onye ụkọchukwu n'ụka Katọlik n'Enugwu, ma bụrụkwa onye ndu ụlọekpere a kpọrọ 'Adoration Ministry'.

Fada Mbaka bụ nnukwu mmadụ a na-anụ aha ya n'ụka Katọlik nakwa na Naịjirịa niile, mana akụkọ a bụ iji kọọrọ gị etu o si malite nakwa ihe mere aha ya ji ewu ewu.

Aha onyonyo, Ejike Mbaka(Rev Father) adọọla ndị ọchichị Naịjirịa aka na nti

Onye bụ Fada Mbaka?

Fada Mbaka

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Fada Mbaka bụ ụkọchukwu a ma ama na Naịjirịa niile n'ihi ụlọekpere ọ bụ onyeisi ya bụ 'Adoration Ministry Enugu Nigeria

Ezigbo aha ya bụ Ejikemuwa Camillus Mbaka.

Nna ya bụ onye obodo Ituku nke dị n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu Steeti.

Dịka ndị ma Mbaka si kwuo, nna ya bụ onye dibịa na-enye ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ.

Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ St Vincent dị n'Agbaogugu, Enugwu steeti.

Fada Mbaka

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Mbaka chiri ụkọchukwu n'ọnwa Julaị afọ 1995

O mechara banye ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu a kpọrọ St Joseph Seminary Ikot-Ekpene.

E chiri Fada Mbaka ụkọchukwu n'ọnwa July afọ 1995, nke a pụtara na o meela afọ iri abụọ na isii o ji bụrụ ụkọchukwu.

Ọ bụ onye mgbasa oziọma e ji ikwu okwuchukwu na-akpọlite mụọ ndị mmadụ mara, ebe ekpere Wenezde nke ọ kpọrọ 'Adoration' nke ọ na-eme na-adọta nari kwuru narị mmadụ.

Mbaka bụkwa otiegwu ụka a ma ama nke tipụtarala ọtụtụ egwu gụnyere: "Miracle Worker"; "Jesus mụ na gị ga-ebi"; Ebube Muonso"; "Aka Ndi Muo Ozi": "Ike M Kwo Aba; "Jesus Obu Ngwongwo"; "Chideraa" wdg.

Ụkọchukwu Mbaka bụkwa onye nwe ụlọọrụ Aqua Rapha nke na-arụpụta mmiri ọṅụṅụ nakwa ụdị ihe ọṅụṅụ Bekee kpọrọ 'Yoghurt'.

Ọ bụkwa onye na-ede akwụkwọ ụka na akwụkwọ ekpere dị icheiche nke o si na ya enweta ego.

Dịka Mbaka ji ọnụ ya kwuo, ndị ọ na-akwụ ụgwọ ọnwa karịrị mmadụ puku iri abụọ na atọ (23,000) kwa ọnwa.

Ndụ Fada Mbaka oge ọ na-eto eto

Fada Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry

Ndị ma Fada Ejike Mbaka oge ọ na-aga akwụkwọ Sekọndịrị na St Vincent Agbogugu kọwara ya dịka nwata na-ama akwụkwọ, onye ejighị ihe gbasara ụka egwu egwu.

Iji maa atụ: Ọkammụta Martin Anikwe, onye ya na Mbaka gụkọrọ sekọndịrị, kọwara Mbaka dịka onye na-anọrọ onwe ya, onye ukwe na amasị nakwa onye ihe gbasara Chineke na-anụ ọkụ n'obi.

Ọkammụta Anikwe kwuru sị, "Oge Mbaka ruru klassị 5, e nyere ya ọkwa 'Catholic sacristan', nke bụ onye isi ụmụakwụkwọ ndị Katọlik," .

"Mụ na ya nọkwa n'otu ndị ukwe oge anyị nọ n'ụlọakwụkwọ."

"Ọ gbaghị m gharịị na Mbaka chiri ụkọchukwu ma bụrụkwa onye a ma aha ya ama taa."

Aha onyonyo, 'O nweghị onye m na-asọ anya makana chukwu na-eche m'- Fada Mbaka

N'aka nke ya, Ọkaiwu Damian Ajah gakwara otu ụlọakwụkwọ ahụ kọwara na "Ihe ọzọ na-amasị Mbaka oge ahụ bụ ịgba egwu ọdịnala n'ụlọakwụkwọ."

Aha onyonyo, Ihe Fada Obiekezie kwuru maka Mbaka

Damian Ajah kwukwara na Mbaka bụkwa onye ihe gbasara Chineke na-amasị nke ukwuu.

O kwukwara na e nwere ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ha na Mbaka na-eso ndị mechakwara chie ụkọchukwu.

Damian Ajah kwuru sị: "Ihe gbasara ụka na Charistmatic, Mbaka bu ya n'isi oge ahụ."

"O nwekwara onye nke ọzọ n'ime ha mechakwara chie fada aha ya bụ Jacob Okoye."

"Ha ruru mmadụ anọ maọbụ ise ndị nọbụ na Charismatic n'ụlọ akwụkwọ mechara chie fada."

Ugboro ugboro Mbaka mere ka a kpụrụ ụka Katọlik n'ọnụ

Aha onyonyo, 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'

1. Amụma Mbaka maka Buhari: Oge a na-achụ nta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2015 nakwa nke afọ 2019, Mbaka buru amụma na ọ bụ Buhari ga-emeri.

O kwuru na Buhari bụ onye ga-edozi obodo Naịjirịa ma bulie ya elu ọzọ.

Aha onyonyo, Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa

Nke a butere ọtụtụ okwu ọjọọ megide Buhari nakwa ụka Katọlik, n'ihi na ndị kwuru na ọ dịghị mma ka onye ndu ụka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara ndọrọndọrọ.

Mana Buhari merichara ntuliaka abụọ ahụ dịka Mbaka si kwuo.

2. Fada Mbaka na Peter Obi:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'afọ 2018, Mbaka katọrọ Peter Obi n'ihi na Obi ekweghị akpọ aha ego oge ọ gara emume owuwe ihe ubi n'ụlọekpere ya.

Oge ahụ bụ oge nkwado maka ntuliaka e mere n'afọ 2019, nke Abubakar Atiku na Peter Obi soro zọọ ọkwa onyeieiala na osote onyeisiala.

Aha onyonyo, Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka

N'onyonyo ya bụ ihe, Mbaka kpọrọ Peter Obi eri eri ma kwuo na ya na Atiku agaghị achịta aja.

Mana Mbaka mechara rịọ Peter Obi mgbaghara maka ihe o kwuru.

3. Buhari na Hope Uzodịmma:

Hope Uzodimma na Fada Mbaka

Ebe foto si, Facebook AMEN, Hope Uzodimma

Nkọwa foto, Fada Mbaka buru amụma na Hope Uzodinma ga-abụ Gọvanọ Imo Steeti

Na mbido afọ 2020, Buhari buru amụma na Hope Uzodinma ga-eweghara ọchịchị Imo steeti.

Oge Mbaka buru amụma a, Emeka Ihedioha bụ gọvanọ Imo steeti, mana okwu mmeri ya ka dị n'ụlọikpe kachasị bụ 'Supreme Court'.

Amụma a Mbaka buru tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na Uzodinma gbara onye nke anọ na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n'Imo steeti.

Aha onyonyo, 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ'

Mana amụma a mechara mezuo oge ụlọikpe kachasị kpebiri ikpe ha wee chụtuo Ihediọha n'oche Gọvanọ, tinye Hope Uzodinma.

Mana n'ọdị nso a, Mbaka kwara arịrị ma kwuo na Uzodinma anaghị azazi ekwentị ya kamgbe ọ rigooro n'oche Gọvanọ Imo steeti.

Nke na-eme ugbua

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ka ọ dị ugbua, Fada Mbaka abanyela ime ọpịpịa abalị iri atọ, nke onyeisi ụka Katọlic n'Enugwu bụ Bishọp Callistus Onaga nyere ya.

O dobeghị anya ihe kpatara Bishọp Onaga ji nye Mbaka ọpịpịa a, mana ọtụtụ na-eche na o nwere ike ịbụ ihe gbasara okwu ndọrọndọrọ ọchịchị o tinyere ọnụ ya n'ọdịnso a.

Cheta na Buhari katọrọ ọchịchị Buhari ma gwa Buhari ka o rituo n'ọchịchị maọbụ ka ndị omeiwu chutuo ya n'ọkwa n'ihi ndakpọ ọnọdụ nchekwa obodo.

Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na Mbaka na-akatọ ọchịchị Buhari n'ihi na Buhari ekweghị enye ya ọrụ ngo ọ chọrọ n'aka ya.