Father Mbaka: Bishop Onaga enyela ndị ụka Katọlik n'Enugu ọpịpịa abalị asaa maka ime ngagharịiwe

Nnukwu Ụkọchụkwụ ụka Katọlik nke Enugwu Dayọsịs bụ Bishọpụ Calistus Onaga enyela ndị ụka ya ọpịpịa abalị asaa maka "imetọ ọlta nchụaja Chukwu."
N'akwụkwọ ozi o binyere aka ya nke o zigara ndị parish ụka nọ n'okpuru ya ụbọchị Tọzde, abalị isii nke ọnwa Mee afọ 2021, Bishọpụ Onaga kwuru na ọpịpịa bụ maka "iji kwụ ụgwọ maka mmerụ ndị na-eso Father Ejike Mbaka merụrụ alta ebe nchụaja nke Ụka."
Ọ sịrị: " N'abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021, ndị na-eso Fada Camillus Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu ji tigbo zogbuo wakpoo Katidral ma merụọ ọlta nso nke nchụaja ma mebikwa ihe n'ụlọ Bishopụ nakwa ụlọrụ nke dayọsis."
Onaga kporo ndị ụka Katọlik oku sị, "Ya mere ana m akpo oku ekpere otu izuụka maka mmekwa na ịkwụ ụgwọ arụ e mere megide ebe ofufe nsọ nke ụka malite n'ụbọchị Fraide, abalị asaa nke ọnwa Mee rue abalị 14,2021."

Ekpere e nyere ha maka ọpịpịa gụnyere Abụọma 51 na 23, na roziri.
Cheta na ndị na-eso Fada Ejike Mbaka mere ngagharịiwe wakpo ụlọ Bishop nakwa Ụlọụka Holy Ghost Cathedral dịka ha mere ngagharịiwe na-achọ Mbaka bụ onye ndu Adoration Ministry Enugwu."
Ihe ndị mere ngagharịiwe mebiri n'ụlọ Bishop Onaga, Holy Ghost Cathedral

Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi gara n'ụlọ Bishọp Ụka Katọlik nke Dayọsịs bụ Calixtus Onaga ụbọchị Tọọzde ịhụ etu e si mebie ihe dịka e mere ngagharịiwe n'ihi Fada Ejike Mbaka na steeti ahụ ụnyaahụ.
Ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'Enugwu ụbọchị Wenezde dịka akụkọ fegharịrị na a na-achọ Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministry achọ mana e mechara Fada Mbaka gbaa ka okwe ma gwa ọha ndị na-achọ ya okwu.
Ụka Katọlik na dayosis Enugwu nyeburu Mbaka ntụzịaka ya nọpụ n'ime ụlọ n'ime ekpere na ntụgharịuche, ma hapụ ikwu maasị maọbụ rụọ ọrụ ọzọ abalị iri atọ.
Ọ bụ ka ọ gachara abalị abụọ Mbaka nọ n'ọnọdụ nnọpụ ahụ ka ndị na-eso ya bịara ekpere 'Adọration', ndị ọrụ ha gwa ha na anya ahụbeghị ya abalị abụọ kemgbe Ọnaga kpọchara ya n'ekwentị ka ha ji malite ngagharịiwe.
Onye ntaakụkọ anyị n'ụlọụka 'Holy Ghost Cathedral' dị n'Ogui na n'ụlọ Bishọpụ ụka Katọlik bụ Calixtus Onaga dị na Independent Layout, Enugwu ụbọchị Tọzde ndị ngagharịiwe ahụ mebiri ọtụtụ ihe.

Ihe ndị ha mebiri gụnyere ụgbọala anọ,ọtụtụ igbentụ oyi, agbatị mposhi nke Bekee kpọrọ WC n'ịchafụ, mpio ugegbe, tankị mmiri, ingini na-enye ọkụ na ihe ndị ọzọ.

Ka ọ dị ugbua, ebe niile ederela jụụ n'ụlọ bishọpụ nakwa ụlọụka 'Holy Ghost Cathedral.'

Ọ na-ewe ha iwe, ngwa ha wepu Ngozi m goziri Nnamdi Kanu

Onye ndu Adoration Ministry bụ Father Ejike Mbaka kwuru na ọ bụ maka ngọzị ọ gọzịrị Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob nakwa okwu o kwuru maka ọchịchị ka ejiri sị ya hapụ ụka ya ruo abalị 30.
Mbaka kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ụka ya okwu n'Enugu dịka ọ pụtara ihe n'azụ ndị ụka ya sị na ọ na-efu efu.
Mbaka sị: "Ha nyere m iwu ka m hapụ Adoration ruo abalị 30; ka m ghara ikwu okwu ruo abalị 30 ma hapụ Enugwu."
Ọ sịkwa na ndị isi ya naakpa nkata etu ha ga-esi kpọrọ ya gawa Rome ma abalị 30 ahụ gachaa.
"A jụrụ m ha ihe mere ha jiri ata m ahụhụ a. Ha enweghi ikike ịgwa m onye m ga-agọzị. Ha na-ewe iwe na m gosiri Nnmadi Kanu. Ọ bụ ngọzị nke ha? Ọ bụ gị na-enye ya ndụ? Ga wepụ ngọzị Chukwa n'isi ya.
"Yabụrụ na ị na-ekwu na m na-akatọ gọọmentị maka etu nchekwa esighi dị, ha a na-ewe iwe na m sị ka gọọmentị nye ntoroọbịa ọrụ? A bụ ụkọchukwu, aga m na-ekwu eziokwu."
Mbaka sịkwa na ya gwara ndịisi ụka na nsogbu nwekwaraike ịdị ma ya bụrụ na ndị ụka ya chọrọ ya achọ.
"Ọ gịnị karị ime ma ya bụrụ na m rapụrụ Enugwu etu ha siri manye? Anyị bụ ndị udo, nke mere m jiri chọọ ka unu na-eruwe isi. Anyị ga-ezute ebe oge ụka ma ya bụrụ na Chukwu kwere," bụ okwu Mbaka gwakwara ndị ụka ya.
Ọ bụghị DSS nwụchịrị m
Mbaka sịka na aka ndị uweojii nzuzo (DSS) adịghị na ọchịchọ a chọrọ taa n'Enugwu.
N'okwu mbụ o kwuru kemgbe akụkọ fegharịrị na a na-achọ ya achọ, Mbaka gwara ndị gbakọrọ n'umuchigbo, Emene Enugwu maka ekpere 'Adoration' na ọ bụghị ndị 'DSS' jichiri ya dịka ụfọdụ na-atụ uche.
Igwe mmadụ mere ngagharịiwe n'Enugwu, Isiobodo Enugwu steeti etiti ụbọchị Wenezde dịka akụkọ fegharịrị na a na-achọ Fada Mbaka achọ kemgbe abalị abụọ.
N'ozi o ziri n'abalị Wenezde, Mbaka, kelere ndị ihe ya na-amasị maka "ịhụnanya ụnụ gosiri m dị m obi ụtọ."
O kwuru sị na ọ bụ oku ndị ụka kpọrọ ka ya gara ịza tupu a kpọ ya oku ka ọ pụta ka ndị mmadụ hụ ya iji gbochie ọgbaghara ịdapụta.
O kwukwara na ụka kpebiri ka ọ kwụsịtụ ekpere adoration ruo abalị iri atọ.
O kelere Chukwu na ndị tigbuo-zogbuo ezubanyeghị na ngagharịiwe ahụ e mere dịka a na-achọ ya, mebie ihe.
O kelere ndị otu Ohaneze maka igosi ya nkwado ka ọ na-akpọtụ.
Fr Ejike Mbaka ọ na-efu efu?

Enugwu daburu ghara ghara dịka puku kwuru puku ndị mmadụ jụpụtara ama taa bụ Wenezde na-eme ngagharịiwe dịka a na-achọ Father Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu kemgbe abalị abụọ.
Akụkọ na Fada Mbaka na-efu na-abịa abalị ole na ole ọ kpọrọ oku ka a chụtuo Muhammadu Buhari n'ọkwa Ọchịchị dịka onyeisiala n'ihi ndakpọ ọnọdụ nchekwa na Naijiria.
Dịka ha nụrụ ya bụ akụkọ nke e ji igwe na-ekwu okwu maa ọkwa ya, ọtụtụ ndị bịara ekpere 'Adoration' nke Fada Mbaka na-ehiwe kwa Wenezde zọpụrụ n'iwe gawa bee Bishop Calistus Onaga.

Ebe foto si, Adoration Ministries Enugu
Ndị na-eso Mbaka ji akwụkwọ ndụndụ na egwu agha na-akpọ oku ka ha a kpọpụtara ha Father Mbaka.
Ihe ụfọdụ na-ekwu bụ "Ihe anyị na-akpo oku bụ ka ha kpọpụtara anyị Daddy anyị; Ihe niile abụghị 'politics, bikonu kpọpụtara anyị Fada Mbaka."
Ndị hụrụ ya anya ikpe ahụ kwuru na ọ bụ abalị abụọ gara aga ka a hụrụ.

Ọ gwara ndị dị ya nso na ya na-aga ụlọ Archibishop Ụka Katọlik nke Enugwu bụ Onaga ịga zaa oku ọkpọrọ ya n'ekwentị mana a hụghịkwa ya ọzọ nke a na-alụ ozi ya.
Oge BBC gara n'ogige ya, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ gụnyere ndị bịara Adoration ụbọchị Wenezde, na-ajụ ese ya.

Mbọ BBC gbara ji nweta nke bụ eziokwu banyere okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ.
Odeakwụkwọ Katọlik dayọsịs nke Enugwu bụ Fada Bajamin Achi kwuru na ya amaghị maka akụkọ ahụ mana ya ga-ajụ ese nke bụ eziokwu.

Otu Fada dị Mbaka nso na-achọghị ka a kpọ aha ya kwukwara na ya amaghị maka ya mana ọ zaghị ekwentị ya.
Kirie ka o si aga dịka ndị na-eso Mbaka mere ngagharịiwe gawa n'ụlọ Achibishọpụ Enugwu bụ Most Rev. Callistus Valentine Onaga:
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:












