Onye ọbụla tiri agadi ihe n'Ogidi ga-ata nnukwu ahụhụ

Aha onyonyo, Onye ọbụla tiri agadi ihe n'Ogidi ga-ata nnukwu ahụhụ

Ndị ntoroọbịa Ogidi apịala nwokorobịa ahụ tiri agadi nwaanyị ihe ọnụ ụtalị dị otu narị maka ịkpa agwa ọjọọ ahụ.

BBC Igbo gara hụ nwaanyị a bụ Christiana Okoye Albert, onye Nkwelle Ogidi n'Anambra Steeti.

A chọpụtara na Christiana nọzi n'ụlọọgwụ twinkle dị n'Ogidi ebe ọ na-anata ọgwụgwọ n'ihi ihe nwokorobịa ahụ bụ Sunday tiri ya n'izuụka gara aga.

Dịka Christiana siri kwuo, na ya na Sunday bụ otu ụmụnna na ọ bụghị nwa ya dịka ndị mmadụ si akọ na soshal midia .

Christiana sị na Sunday batara n'ụlọ ya ebe ọ na-akpa azịza ga buru akpa onye bị n'ụlọ ha.

Na ngwa ngwa ya gwara ya ka o bute akpa ahụ ka a mara ihe dị n'ime ya ka o bidoro kụwa ya ihe ka onye ohi.

Nwoke tọtara nwaanyị ahụ bụ Emmanuel Chucks Albert kwara arịrị sị na ọ bụ ebe ya bi n'Aba ka ọ nọ hụ ihe onyonyo ebe a na-etigbu nwanne ya nwaanyị ụkwụ adịghị na soshal.

Albert rịọrọ gọọmenti ka ọ taa Sunday ahụhụ ruru ya n'ihi na o tiela ọtụtụ mmadụ ihe n'Ogidi.

Onyeisi ndị ntoroọbịa Nkwelle Ogidi bụ Ifeanyi Aniekwena gwara BBC na ọ bụ ya na ndị otu ọrụ ya gara jide nwokorobịa ahụ ma pịa ya italị ugboro otu nari iji gosi ya ka iti ihe si atọ.

Aniekwena kwuru na akparamagwa ahụ abụghị nke ha ga-anabata chaa chaa n'obodo Ogidi.

Ọ dọrọ aka na nti ka ndị mmadụ kwụsị ịṅụ ọgwụ na anwụrụ ike n'ihi na ọ na-eme mmadụ ịkpa agwa dịka anụmanụ.