2021 Prophecies: Ihe Mbaka, Oyedepo, Adeboye, Suleiman na ndị ụkọchukwu mara n'amụma maka 2021

Ebe foto si, Mbaka,Adeboye na Oyedepo
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Dịka a banyere afọ ọhụrụ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu a ma ama na Naijiria atọpeela ngwugwu ihe ha 'hụrụ' ga-eme n'afọ 2021.
Ụfọdụ bụ okwu nkasi, ebe ụfọdụ bụ okwu na-enye nkoropụobi.
Lee ụfọdụ n'ime ha:
Naijiria ga-aba oge ihe isi Ike ọzọ - Fada Mbaka

Ụkọchukwu Ụka Katọlik a ma ama ma bụrụkwa onye hiwere "Adoration Ministry" n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ala Naijiria ga-aba n' ihe isi ike kacha n'afọ 2021. Mana, ọ sị: "n'ime ihe isi ike a, ụfọdụ ndị mmadụ ga na-eme ọfụma."
"Ihe ga-esikatara ndị mmadụ ike mana ụfọdụ ndị mmadụ, afọ ga-abụrụ ha afọ kachasị mma ná ndụ ha."
O kwuru na "ụfọdụ ezinaụlọ nọ n'ọzara a ga-agbapuru ha osimiri na 2021."
N'okwu coronavirus, Mbaka kwuru na Chineke ga-ebupu ya nụ ọrịa dịka a ga-esite "n'afọ coronavirus jụrụ ga n'afọ a zachapụrụ coronavirus".
A na-achọpụta ọkwụ mgbochi Coronavirus, ụdị ọzọ a na-apụta- Adeboye

Ebe foto si, RCCG
N'amụma o buru na ụka mmalite afọ 2021, Onyeisi Ụka Redeemed Christian Church of God' bụ Enoch Adeboye kwuru na "dịka a na-emepụta ọgwụ mgbochi Coronavirus, na ụdị nje ahụ ọzọ ga na-apụta, " ganye na ụwa ekweta na n'ezịa nchedo si na Chukwu."
O kwuru na "Ụfọdụ ihe ndị mere n'afọ 2020 ga-aganihu n'afọ 2021."
Ọ gara n'ihu sị, "Chukwu chọrọ ka anyị nọ na Naijiria mata na naanị Chineke pụrụ igbo ọgụ."
Okwu 'Igbo Presidency' ga-akụsa- Ayodele
Onye ndu ụka INRI Evangelical Spiritual Church bụ Elijah Ayodele, sị na ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 agaghị erute Igbo aka.

Ebe foto si, Elijah Ayodele Ministries
Ọ sị: "Zoning agaghị ekwe omume. E wepụ nke a, a ga-enwe ọtụtụ ndọrọndọrọ ụka maka "zoning", etu ahụ ka Igbo inweta ọkwa onyeisiala ga-adaa mmiri n'afọ 2023."
O kwuru na otu otu kara aka ga-apụta na-ekwusi ike maka Igbo inweta ọkwa onyeisiala. Ha ga-agbalị iwepụta ndị tozuru etozu.
"Ọtụtụ ndị Igbo na-achọ ịzọ ọkwa onyesisala ga-adapụ n'etiti ụzọ."
Ọnwụ onyeisiala
Ayodele kwukwara na otu onyeisiala nọ n'ọkwa ọchịchị ga-anwụ, ebe otu onyeisiala chiburu mbụ ga-anwụkwa.
Bola Tinubu
Ayodele dụrụ Bola Ahmed Tinubu ọdụ ka ọghara imefu ego sị na ọ na-azọ ọchịchị.
Aka gbara ụka mgba ga-ada- Oyedepo

Ebe foto si, Winners Chapel
Bishop David Oyedepo nke ụka 'Living Faith Church Worldwide' a ma dịka "Winners Chapel", si na aka ọbụla megidere ụka ga-ada.
Ọ gara n'ihu kwuo na ekwensu ji covid-19 ebuso ụka agha.
Ọ sịkwara, "Ụka bilie megide mmadụ, onye ahụ nke ya agwụla. Ụka bilie megide ọchịchị maọbụ ewumewu,ewumewu ahụ ga-ada."
Mana o kwuru na 'Anyị na-aga n'ala e kwere ha na nkwa."
Osote Onyeisiala ga-abụ Onyeisiala- Suleiman

Ebe foto si, Apostle Johnson Suleiman/Facebook
Ụkọchụkwụ a ma ama ma bụrụ onye nwe ụka Omega Fire Ministries International bụ Apostle Johnson Suleiman, kwuru na onyeisiala ga-abata n'oche agaghị esi n' Ugwu Naijiria.
N'amụma ọ mara maka afọ 2021, Suleiman kwuru na ọ bụ onyeji ọkwa osote onyeisiala ga-abụ Onyeisiala.
"Ahụrụ m ka na-ahapụ Ugwu. Dinwenụ gwara m mụ ya na ntị m na onye nke abụọ ga-abụ onye nke mbụ.Ihe a bụ amụma. Naijiria agaghị ekwewa, Agha agaghị ada."






