Imo state: "Ihedioha nwereike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya" - Mbaka

Aha onyonyo, Imo state: "Ihedioha nwere ike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya" - Mbaka

Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba.

Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ.

Ụkọchukwu ahụ kwuru na afọ juru ya nke ukwuu etu ụlọikpe kachasị si kpee ikpe Ihedioha na Hope Uzodinma bụ onye nọchiri ya dịka gọvanọ ugbua.

Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgbagha maọbụ na-ekwu okwu ọjọọ maka amụma ya niile.

Cheta na Emeka Ihedioha gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka, na a gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị

Akụkọ ga-amasị gị