Adoration Ministry Enugu Nigeria (AMEN): Ihe mere Rev Fr Ejike Mbaka ji mechie ụka ya ruo otu ọnwa

Mbaka na-agwa ndị otu ya okwu

Ebe foto si, Screengrab

    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ozi na-erute anyị aka ugbua na-ekwu na-emechiela ụlọụka "Adoration Ministry" nke Father Ejike Mbaka bụ onyeisi ya ruo otu ọnwa.

Onye ntaakụkọ BBC gakwara ebe ahụ ma hụ na a gbachịrị ya bụ ogige ofufe dịka akụkọ si kwu.

Lee ihe nkiri gosiri ka ebe ahụ dị ugbua.

N'akwụkwọ ozi o wepụtara nso nso a , Mbaka kwuru na a ga-agbape Adoration ministry ọzọ n'ụbọchị June 10 dịka a malitere mgbachị ahụ n'ụbọchị Mee 10,2021.

Ọ rịọrọ ndị otu ya ka ha dere duu makana ọ bụ ekpere ka ọ gara ikpe ma na-arịọkwa ha ka ha gaa kpee ekpere nke ha.

Onye ntakụkọ anyị kwụkwara na ọ hụrụ ndị otu Adoration ebe ha kwụcha n'akụkụ ụlọụka ahụ ma na-ekiri etu e si gbachie ebe ahụ n'ụtụtụ a.

Cheta na Bishop Onaga kwuru ka ndị ụka Katọlịk nọ n'Enugu mee ọpịpịa maka etu ndị otu Father Mbaka si bia mebisie ihe n'ogige Bishop Katọlik nke Enugu.

Father Ejike Mbaka arịọla Bishop Onaga na ụka Katọliki mgbaghara

Fr Mbaka na Bishop Onaga

Ebe foto si, Youtube Screengrab

Rev. Fr Ejike Mbaka arịọla onyeisi ụka Katọliki n'Enugwu bụ Bishọp Callistus Onaga, nakwa ụka Katọlik n'uwa niile mgbaghara maka ọgbaghara ndị otu ekpere ya mere n'Enugwu n'ụbọchị Wenezde, abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021.

Mbaka, onye nwe ụlọ ekpere 'Adoration Ministry', gburu ikpere n'ala rịọọ Bishop Onaga mgbaghara maka ihe niile ndị ekpere ya mebiri n'ụlọ Bishọp dị na Independence Layout Enugwu, nakwa n'ụlọụka Holy Ghost Cathedral dị n'Ogui Enugwu.

Ọ rịọrọ mgbaghara a oge ọ na-aka ụka ụbọchi Sọnde, 9 nke ọnwa Mee n'Obi Adoration.

Mbaka ji ohere ahụ kwuo na onweghị onye o zipuru ka ọ gaa mebie ihe n'ụlọ Bishọp.

Fada Mbaka

Ebe foto si, Facebook/AMEN

Ọ dọkwara ndị ekpere ya aka na ntị ka ha na-erubere ụka katọliki isi mgbe niile.

Mbaka kwuru na ya ga na-erubere ụka isi dịka onye ụkọchukwu.

O kwuru sị: "Mụ na Bishọp m anaghị ese okwu, onweghị esemokwu ọbụla dị n'etiti anyị abụọ."

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

"Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ itinye esemokwu n'etiti anyị mana ihe dị n'ime m agaghị ekwe ka ọ gaziere ha."

Aha onyonyo, 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo ọrụ 400,000'

Mbaka gara n'ihu kwuo sị: "Anaghị m agba ụka Katọlik mgba. O nweghị ike ime."

"Ihe niile m nwere bụ ụka nwe ya. Arụọla m ọrụ n'ụka ihe karịrị afọ iri abụọ na ise, gịnị ka m ga-eji bido ịgba ya mgba?"

Mbaka kwuru na ọ bụ ndị ọzọ na-abụghị ndị ụka Katọlik tinyere aka oge ahụ ndị mmadụ na-achọ ya wee mebie ihe na be Bishọp.

"Egburu m ikpere n'ala wee n'arịọ nzukọ Katọlik mgbaghara maka ihe niile merenụ," Mbaka kwuru.

"Ọ bụrụ na o nwere ihe m kwuru n'ụzọ adịghị mma, biko gbagharanụ m."

Aha onyonyo, 'O nweghị onye m na-asọ anya makana chukwu na-eche m'- Fada Mbaka

Cheta na ụbọchị Wenezde gara aga ka ndị otu Adoration gagharịrị Enugwu mee ngagharịiwe n'ihi na ha kwuru na a tọrọla ụkọchukwu ha bụ Mbaka.

Ndị ekpere Adoration ji iwe ahụ gaa kurie ụlọ Bishop Enugwu bụ Callistus Onaga n'ihi na ha boro ya ebubo na ọ ma ihe mere Fada Mbaka.

N'ihi nke a, Bishop Onaga tiri iwu ka ndị ụka katọliki n'Enugwu kpee ekpere pụrụ iche ma mee ọpịpịa otu izuụka iji rịọọ Chukwu mgbaghara maka mmetọ ndị ahụ mere ngagharịiwe metọrọ oriri nsọ n'ime ụlọụka Holy Ghost Cathedral Enugwu.

Aha onyonyo, Ihe ga-agwọ coronavirus nwereike bụrụ nwa mpe mpe ihe - Mbaka

N'oziọma ya n'ụbọchị Sọnde a, Fada Mbaka nyere ndị otu ya niile ntụziaka ka ha sonye kpee ya bụ ekpere nke Bishọp kwuru ka e kpee.

Mbaka kwere nkwa na ya na ndị otu ya niile ahụ mebiri ihe ga-aga n'igwe ga rịọọ Bishop Onaga na ndị ụkọchukwu niile mgbaghara.