Ubakala Police Attack: Ndị ekperima awakpola ụlọọrụ ndị uweojii n'Ubakala, Abia State

Ndị ekperima bucha egbe awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Apumiri Ubakala, n'okpuru ọchịchị Umuahia South, isi obodo Abia Steeti.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ chọpụtara na ndị ekperima ahụ mụnyere ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọk, ọ gbaa jaa jaa.
Ọ hụkwara ihe ruru ụgbọala iri na ise nke a gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii ahụ.
BBC nụkwara na mmadụ abụọ nwụrụ na mwakpo ahụ, mana onye ntaakụkọ anyị ejighi anya ya abụọ hụ ozu ha.
Ndị mmadụ kwuru na e bupụla ozu ndị ahụ tupu onye ntaakụkọ anyị erute ebe ahụ.
Ndị uweojii ekweghị ka onye ntaakụkọ anyị banye n'ogige ahụ, mana ọ nọrọ ote aka seta foto ihe ndị nke anya ya nwere ike ịhụ.
Otu onye uweojii na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara ndị nọ ebe ahụ na ya bụ mwakpo malitere n'elekere abụọ na ọkara nke isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a.
"Ndị mere ihe a bụ ụmụ okorobịa karịrị 20 n'ọnụọgụgụ bucha nnukwu egbe," onye uweojii ahụ kwuru.
Otu onye bi n'okirikiri ahụ kwuru na ha nụrụ ụda egbe ụdị nke mmadụ anụtụbeghị na ntị mbụ.

Nwoke a na-achọghị ka a kpọpụta aha ya kwuru sị: "Anyị chere na agha amalitela na mpaghara anyị."
"Mgbe ụda egbe bidoro ịka njọ, ebidoro m ịtụ alo ebe m ga-esi gbaa ọsọ ma ọ bụrụ na ihe karịa."
"Obi mmapụ ekweghị anyị rahụ ụra, onye ọbụla chịcha obi ya n'aka."
Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtakwara na ọtụtụ ụlọahịa dị nso n'okirikiri ebe ya bụ ihe mere emepeghị emepe dịka

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ n'ọnụ Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti, amịtaghị mkpụrụ.
Ọ zaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ, ọ saghịkwa ozi anyi zigaara ya n'ekwentị.
Arụ gbaa afọ...

Kamgbe mmalite afọ 2021, mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii nakwa igbu ndị ọrụ nchekwa bụzị ihe na-eme kwadaa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Site n'Abia steetị gaa Enugwu, si Ebonyi gaa Anambra, si Imo banye Delta steeti, ihe na-eme be Oke, na-emekwa be Ọgịnị.
Ndị oji egbe na-akpagharị na-agba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, na-egbu ndị uweojii ma na-anapụ ha egbe.
Nke a mere ka ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ hibe otu nche nke ha kpọrọ 'Ebube Agụ', mana nhibe otu a emebeghị ka nchekwa ka mma.









