Orlu Attack: E gbuola ndị 'unknown gunmen' asatọ chọrọ iwakpo ogige ndị uweojii

Ndi Ji egbe n'Orlu

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ndị Ji egbe n'Orlu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Obodo Ọlụ dị n'Imo steeti na-ekpo ọkụ ọkụ n'ime abalị ụbọchị nke isii nke ọnwa Mee dịka ndị bu egbe wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo ahụ nke butere ọnwụ mmadụ asatọ n'ime ndị mere mwakpo ahụ dịka a napụkwara ha ụgbọala ha jiri bịa ọgụ.

Ndị uwojii Imo kwuru na ha nwetara egbe AK 47 anọ, otu egbe 'pump action', ụgbọala Toyota Siena abụọ, otu ụgbọala 'Toyota Camry', otu ụgbọala Toyota Hilux , otu ụgbọala SUV Highlander, ụgbọala SUV Land Rover, otu ụgbọala Nissan Pick up na ọgwụ ọdaeshi.

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndi uweojii na ndị agha Naịjirịa tinyere aka were hụ na mwakpo a agaghị etu ndị kpara nkata ya jiri chọọ.

Ndị ji egbe a na ndị ọrụ nchekwa kwara mgbọ ruo ọtụtụ awa dịka ndị agha si Obinze bịara soro ibuso ndị ji egbe a ọgụ.

Ihe onyonyo e tinyere na Facebook gosiri oge ndị ji egbe ji ụgbọala ha bata Ọlụ, tupu ha na ndị Ọlụ nchekwa akwawa mgbọ n'ime abalị.

Ịkwa mgbọ a mere ka ụjọ baa n'ahụ ọtụtụ ndị mmadụ bi n'Ọlụ nke mere ụfọdụ n'ime ha gbara ọsọ gawa Owere.

Ụgbọala ndị ji egbe wakpor ụlọ ọrụ ndị uweojjii n'Orlu

Ebe foto si, Ekeoma Daniel

Ụgbọala ndị ji egbe wakpor ụlọ ọrụ ndị uweojjii n'Orlu

Ebe foto si, Ekeoma Daniel

Ụgbọala ndị ji egbe wakpor ụlọ ọrụ ndị uweojjii n'Orlu

Ebe foto si, Ekeoma Daniel

Ụgbọala ndị ji egbe wakpor ụlọ ọrụ ndị uweojjii n'Orlu

Ebe foto si, Ekeoma Daniel

Ụgbọala ndị ji egbe wakpor ụlọ ọrụ ndị uweojjii n'Orlu

Ebe foto si, Ekeoma Daniel

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Otu onye bi n'Ọlụ gwara onye ntaakụkọ ya na BBC Igbo kwuru na-agbara otu ụgbọala agha ndị agha ọkụ n'Umuna Junction.

O nwekwara ndị a na-ekwu na mgbọ tụrụ mana BBC Igbo ka na-agba mbọ inwete nke bụ eziokwu.BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Godson Orlando Ikeokwu mana ọzaghị ekwentị ya.

Onye ntaakụkọ ya na BBC Igbo kwuru sị na o nweghị onye uweojii nwụrụ na mwakpo a.

Ọ sịkwa na eburula ozu ndị a egburu na ụgbọala a nwụchịrị gawa Owere bụ isi obodo Imo steeti.

Ọ bụ ụnyaahụ ka onyeisi ndị uweojii ọhụrụ bụ Abutu Yaro malitere ọrụ n'Imo steeti.