Owerri Prison Break: Ọ dịghị mma etu onyeisi uweojii jiri bo ipob na emeghị nchọpụta - Uwazuruike

Ralph Uwazuruike
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ralph Uwazuruike nke Massob ekwuola na etu Gọọmenti si so ihe mere n'Owere, Imo steeti, ebe ndị ji egbe wakporo ụlọmkpọrọ tọhapụ ndị e ji eji, ekwesịghị ekwesị.

Ndị ji egbe wakporo ụlọmkpọrọ na ogige ndị uweojii ma tọhapụ ndị nga karịrị otu puku.

Lee ọkpụrụkpụ okwu Uwazuruike tụpụtara na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere taa maka ihe merenu:

'O (onyeisi ndị uweojii) kwesịghị ịkpọ aha ganye na e mechaa nchọpụta.'

Uwazuruike kwuru na o kwesighị ekwesị ịkpọ aha onye ọbụla ganye ma e mechara nnyocha tọtọ atọ.

"E nwere ntuziaka na a ga-eme nchọpụta ihe mere. Ọ bụghị ihe kwesịrị ịkpọ aha onye ọbụla n' emechaghị nchọpụta"

"Ọ bụrụgodi na o nwere obi na ọ bụ ndị Ipob, o kwesịghị ikwupụta ya ma ha emebeghị nchọpụta."

'Ndịiche dị na etu gọọmenti etiti si so ihe mere n'Ebonyi na nke mere n'Owere'

Uwazuruike sị, "Ụbọchị ole gara aga n'Ebonyi steeti e gbusiri mmadụ rinne n'ebe ahụ, mana onyeisi ndị uweojii agaghị ebe ahụ."

"Mana ụlọmkpọrọ bụ ebe ndị mmadụ anwụghị, onyeisi ndị uweojii agbara gaa ebe ahụ na-erughi awa 24."

"Ọ rara ahụ ịhụ onyeisi ndị gọọmentị ekwuo okwu."

"O (Ihe mere) gosiri na enweghị nchedo n'Ala Igbo."

'Ndị ọrụ nchekwa arụghị ọrụ ka dịka o siri kwesị'

Uwazuruike jụrụ ajụjụ sị, "Kedụ ka ha (DSS) na ndị uweojii siri nọrọ mmadụ karịrị 100 akpaa nkata, ha anụghị maka ya tupu o mee?"

Ọ gara n'ihu sị, "Ọ bụrụ n'ala ndị ọzọ, onyeisi ndị uweojii kwesịrị itinye akwụkwọ arụkwaghịm."

'Enweghị ikpenkwụmọtọ butere ọgbaghara'

Uwazuruike rụtụrụ aka na ọ bụ enweghị ikpenkwụmọtọ bu na ala adịghị mma.

Ọ sịrị, "Ọ bụ maka obodo adịghị mma ka ụmụaka jiri buru egbe."

"E mee nwa ka e mere ibe ya, ọgbaghara niile alaa. Enweghị ikpemkwụmọtọ na-ebute ọgbaghara."

Lee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post