Ihe dị iche na kalenda ndị Igbo na nke Bekee

Ụbọchị n'izuụka Igbo
Nkọwa foto, Foto na-egosi aha ụbọchị ahịa n'ala Igbo... Eke, Orie Afọ & Nkwọ.

E nwere ụbọchị ahịa anọ n'ala Igbo.

Ha bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ.

Ahịa ndị a ka ndi Igbo na-eji agu afọ nke a na-akpọ 'Igbo calendar' na Bekee.

Ụbọchị n'izuụka Igbo
Nkọwa foto, Foto na-egosi aha ụbọchị ahịa n'ala Igbo... Eke, Orie Afọ & Nkwọ.

Ọtụtụ obodo nwere ụzọ ha na-esi agụ ụbọchị, izuụka, ọnwa na afọ nke ha, mana nke ndị mmadụ kacha mara bụ nke ndị Bekee kpọrọ 'gregorian calendar'.

Kedụ ka kalenda ndị Igbo sị dị iche na nke ndị Bekee?

Ọnwa Ọgọstu 2020
Nkọwa foto, Kalendar nke ndị Bekee.

Iji afọ 2020 maa atụ

Afọ 2020 nke Bekee nwere ọnwa iri na abụọ (12).

Nke Igbo nwere iri na atọ (13).

A bịa n'ụbọchị ole dị n'otu ọnwa, nke ndị Bekee dị iri atọ (30) ebe nke ndị Igbo dị iri abụọ na asatọ (28).

Nwale kalenda Igbo na Gregorian

Ihe ndị Igbo na-akpọ ọnwa niile dị afọ nakwa ihe ndị Bekee na-akpọ ha

Odumobi n'Eri

Ebe foto si, Odumobi

Ka anyị nwale kalenda nke Gregorian na ọnwa ya na nke Igbo dịka Odumegwu Obudigwe bụ onye ọkachamara n'omenala bụkwara onye nchịkọta omenala na njem elete n'Aguleri, Anambra steeti.

January/ February- Ọnwa ntufu

March - Ọnwa etufucha agunye nge

April- Ọnwa nge

May- Ọnwa abụọ

June- Ọnwa atọ

July- Ọnwa anọ

August- Ọnwa ise

September - Ọnwa isii

October - Ọnwa asaa

November - Ọnwa asatọ

December - Ọnwa ụma mara afọ

- Ọnwa ntufu (ọnwa nke ịkpaazụ)

bọchị izuụka Bekee na nke Igbo

Nwale ụbọchị izuụka Igbo na Gregorian

Dịka ndị Bekee na-eme ọnụ ọgụgụ izuụka ha site n'ụbọchị ụka (Sunday) rue n'ụbọchị ezumike (Saturday), ndị Igbo na-eji ụbọchị ahịa eme ọnụ ọgụgụ nke ha.

Ha na-ebido n'ahịa Eke rue na Nkwọ.

E nwere ụbọchị anọ (4) n'otu izu mana nke Bekee nwere ụbọchị asaa (7).

Izuụka ole ka ndị Igbo nwere?

Dkt Nnabuihe nke Mahadum Legọs kọwara na izuụka asaa bụ otu ọnwa n'ọgụgọ afọ Igbo mana izu anọ bụ otu ọnwa na nke ndị Bekee.

Izuụka ole dị n'otu ọnwa nke ndị Igbo?
Nkọwa foto, Ọmụmatụ ọnwa Ọgọst 2020 na izuụka ole o nwere
Kalenda Gregorian nke Ogost 2020

Etu kalendar Igbo na nke Gregorịan siri yie onwe ha.

Myiri na ndịiche dị n'etiti kalendar Igbo na nke Gregorịan

Akụkọ ga-amasị gị