Risikat Azeez: Ihe na-akpata mkpụrụ anya mmadụ ji acha anụnụ anụnụ

Risikat Azeezat na ụmụ ya

Ebe foto si, Instagram/Mofebamuyiwa

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ malitere inyere Risikat Azeezat na ụmụ ya aka dịka akụkọ kwuru na di ya chụpụrụ ha n'ihi ụcha anya ha.

Na nsonso a ka akụkọ pụtara gbasara otu nwaanyị aha ya bụ Risikat Azeez onye di ya chụpụrụ n'ụlọ n'ihi na mkpụrụ anya ya na nke ụmụ ya abụọ na-acha anụnụ anụnụ (blue).

Mana ngwangwa akụkọ ahụ pụtara na soshal midia, ọtụtụ ndị mmadụ malitere inye nwaanyị ahụ na ụmụ ya ihe onyinye pụrụ iche iji nyere ha aka.

Ya bụ ihe tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya n'ihi na anaghị ahụ ya bụ ihe kwadaa.

Mana gịnị na-akpata ụdị ọnọdụ a?

Ihe nwere ike ime ka anya mmadụ na-acha anụnụ anụnụ

Risikat Azeezat na ụmụ ya

Ebe foto si, Instagram/mofebamuyiwa

Nkọwa foto, Risikat Azeezat na ụmụ ya

Dọkịta Chinedu Njezi bụ onyeisi ụlọọgwụ anya a kpọrọ Sight Haven.

Ọ kọwara na Risikat Azeez nwere ike inwe ọnọdụ anyarị anya nke bekee na-akpọ 'occular albinism'.

'Occular albinism' bụ ọnọdụ mgbe 'melanin' kọrọ ụkọ n'anya mmadụ.

'Melanin' bụ ihe na-eme ka ahụ mmadụ nakwa mkpụrụ anya ya gbajie oji.

Ọbụkwa 'melanin' na-echekwa akpụkpọ ahụ nakwa mkpụrụ anya mmadụ ka anyanwụ ghara imebi ya.

Dịka dọkịta Njezi si kọwaa, ndị bụ anyarị (albino) anaghị enwe 'melanin' n'ahụ ha, ọtụtụ n'ime ha anaghịkwa enwe ya na mkpụrụ anya ha.

Njezi kwuru sị: "N'ime ndị anyarị mmadụ iri, asatọ ga-enwe 'occular albinism, mana n'ime ndị ojii otu puku, naanị otu ka e nwere ike ịhụ 'ọccụlar albinism' n'anya ya".

Ọ gara n'ihu kọwaa na ya bụ ọnọdụ abụghị nke naanị nne maọbụ naanị nna na-ebufere nwa; ọ ga-esiriri n'aka ha abụọ.

Na nkọwa ya, ọtụtụ n'ime anyị nwere anyarị n'ime ahụ anyị, mana ọ pụtaghị ihe; Bekee na-akpọ nke a 'recessive gene'.

Ọ bụrụ na onye nke ya pụtara ihe nke ọma gakwuru onye ọzọ nke ya apụtachaghị ihe, ha abụọ nwere ike ịmụta ụmụ anya ha ga na-acha anụnụ anụnụ dịka Risikat Azeez na ụmụ ya.

'Occular Albinism' ọ bụ ọrịa?

Aha onyonyo, Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ

'Occular Albinism', dịka dọkịta Njezi si kọwaa, abụghị ọrịa kama ọ bụ ọnọdụ.

Obere ihe nhiahụ ndị nwere ya ga na-agabiga bụ na ọkụ ga na-enyekarị ha nsogbu n'anya.

Njezi kwuru sị: "Ihe izizi a ga-eme bụ inye ha ugogbo anya na-egbochi anwụ ịba mmadụ anya, nke Bekee kpọrọ 'sun shades'.

O kwukwara na ọ bụghị ndị niile nwere ọnọdụ a ka ọ na-enye nsogbu.

Gịnị ọzọ nwere ike ime ka ụcha mkpụrụ anya mmadụ gbanwee?

'Heterochromia irides'

Ebe foto si, ERIC LAFFORGUE

Nkọwa foto, Nwaada Diakité bụ nwa Ivory Coast nwere 'Heterochromia irides'

Ọnọdụ ọzọ nwere ike ịkpata ụdị ihe a bụ nke dọkịta Njezi kpọrọ 'Heterochromia irides'.

Mana nke a bụ mgbe mkpụrụ anya abụọ nwere ụcha dị iche iche, otu nwere ike na-eji oji, nke ọzọ na-acha anụnụ anụnụ.