Usman Alkali Baba: IGP ọhụrụ na ndị IGP rụọrọla ọrụ n'afọ iri gara aga

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nọrọ Ụbọchị Tuzde tinye Usman Alkali Baba n'oche Onyeisi ndị uweojii Naijiria.
Tupu nke a emee, Mohammed Adamu bụ onye Buharị họpụtara n'afọ 2019 bụ onyeisi ndị uweojii.
N'ime afọ iri gara aga nke ọchịchị Goodluck Jonathan na Buhari, enweela ndị isi uweojii mmadụ isii ma a gụpụ nke a nọ ugbua.
Lee ihe ndị i kwesịrị ịma maka ha:
Hafiz Ringim (2010-2012)
Hafiz Ringim chịrị ndị uweojii Naijiria n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan.
Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa ka ndị Boko Haram kpara ike wuru ewu dịka ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọọrụ UN nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja n'afọ 2011.
Ringim pụrụ n'ọkwa ya n'afọ 2021.
Ugbua ọ na-arụzi ọrụ ugbo n'Okpuru ọchịchị ya bụ Ringim na Jigawa Steeti n'Ugwu Awusa.

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Muhammad D Abubakar (2012-2014)
Muhammad Abubakar a ma dịka D Abubakar rụrụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii naanị afọ abụọ dịka onye ọ nọchiri.
Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa ka ngagharịiwe 'fuel subsidy nke afọ 2012 mere.
Ugbua, ọ bụ 'Pro-Chancellor' na onyeisioche mahadum 'Al Hikmah University' dị n' Ilorin, Kwara steeti, ya na oke ọgaranya n'Afrịka bụ Dangote gọrọ ọgọ dịka nwa ya bụ Jamil Abubakar lụrụ nwa Dangote.
Sulaiman Abba (2014-2015)
Sulaiman Abba bụ otu n'ime ndị bụbu ndị isi ndị uweojii anọghị anọ n'ọkwa ya dịka ọ nọrughị otu afọ.
Abba nọchiri Abubakar dịka onyeisi ndị uweojii ma nọkwaa n'ọkwa ahụ rue oge ntuliaka afọ 2015 tupu Jonathan ewepụ ya n'ọkwa.
Sulaiman anọọla n'ọkwa dị iche iche n'ọrụ ndị uweojii nke gụnyere onye nche pụrụ iche (ADC) nke nwunye onye bụbu Onyeisiala Sani Abacha bụ Maryam Abacha.
Solomon Arase (2015-2016)
Solomon Arase bụ onyeisi ndị uweojii gburugburu nke iri na asatọ tupu Jonathan etinye ya n'ọkwa.
Ọ bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka nnyocha a kpọrọ "criminal intelligence and investigations bureau".
Ọ bụ n'oge ya ka e mere ntuliaka afọ 2015 nke webatara ọchịchị ndị APC.
Ọ rụkwara na Namibia dịka ndị uweojii na-ekpe udo n'aha otu United Nations "Namibia peace keeping operations of United Nations", dịka onyeisi ndị uweojii.
Nke a bụ IG dịka onye ọ nọchiri nọrọ n'ọkwa ya naanị otu afọ.

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Ibrahim Idris (2016-2019)
Ibrahim Idris bụ onyeisi ndị uweojii mbụ Onyeisiala Buhari ka ọ banyechara ọkwa onyeisiala.
Dịka Wikipedia si kwuo, Ibrahim bụ onyeisi uweojii kwuputara n'ọha ihe ndị o nwere nke mere ka ngalaba 'Code of Conducts Bureau' too ya.
Mohammed Adamu (2019-2021)
Ihe ndị mmadụ na-eji echeta Mohammed Adamu bụ ngagharịiwe End SARS mere oge ọ nọ n'ọkwa.
N'agbanyeghị na o kposara SARS, ọtụtụ kwenyere na ọ gbaghị ọsọ mmiri ahụ n'oge.
Onye Nasarawa steeti, gụrụ 'Geography' na mahadum, ọ rụrụ ọrụ afọ abụọ tupu ewepụ ya n'ụbọchị Tuzde.

Usman Alkali Baba(2021)
Alkali Baba bụ onye a kpụ n'ọnụ dịka ọ banyere n'ọkwa onyeisi ndị uweojii ugbua, ugbua.
Ọtụtụ ụmụ Naijiria nọ na nchekasị dịka o si gbasa ọnọdụ nchekwa obodo nke na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa n'Ugwu Awụsa.

Ebe foto si, Police
Ọrụ chere Alkali Baba dịka onyeisi Uweojii ọhụrụ
Na nso nso a mwakpo na-arị elu n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Nke kachasị ewu na nso nso a bụ mwakpo a wakporo ụlọmkpọrọ nakwa isiụlọọrụ ndị uweojii n'Owere, isiobodo Imo steeti ebe ndị e ji eji karịrị otu puku riri mbombo ọsọ.
N'ọnwa atọ gara aga, ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ anọ n'Ugwu Naijiria.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ, 'Federal College of Forestry Mechanisation' dị na Kaduna ndị ntọ tọọrọ ka nọ n'aka ndị ji ha.
N'Ọdịda-Anyanwụ Naijiria, nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ka na-aga n'ihu dịka ọnwụ, na mmebi ihe na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.











