Leornard Onyia: Etu ọnwụ Anando West n'obodo Vikas Puri, India jiri bute ngagharịiwe

Ebe foto si, Anando
Ụmụ Naịjirịa bi n'obodo Vikas Puri dị na mba India ekwuola ihe kpatara ha jiri mee ngagharịiwe n'ụbọchị Sọnde n'obodo ahụ.
Otu onye Naịjirịa nọ obodo ahụ achọghị ka akpọọ aha ya niile kwuru na ọ bụ oke ogbugbu ndị Naịjirịa kpatara ngagharịiwe a.
Nke a na-abị a ka ndị Naịjirịa kwuru na ndị uweojii kwuru gburu otu onye ọzọ n'ime ha.
Dịka BBC Igbo chọpụtara, nwa amadị a e gburu bụ Leonard Onyia e ji "Anado West" mara, bụ onye Enugwu Steetị gbara ihe dịka afọ iri anọ na atọ.
Akụkọ kwuru na Maazi Eneonyia ebiela na mba India ọtụtụ afọ na e nweghi nsogbu ikike ọbụla.
Otu nwaafọ Naịjirịa ọzọ bi n'obodo ahụ gwara BBC Igbo na nke a mere n'ụtụtụ ụbọchị ụka 28 Maachị 2021 mgbe Anaedo na-aga ibute mmadụ n'ọdọụgbọelu.
Ndị uweojii kwụsị ya n'ụzọ ma bido ịgba ya ajụjụọnụ, dịka ha na-ajụ ya ha malitere iji na-eti ya ihe.
Nke a mere onye Naịjirịa ọzọ hụrụ ka ihe a na-eme ji bịa ka ha ọzọpụta Anaedo mana ọgbaghara dapụtara n'etiti ha na ndị uweojii ahụ.
E buuru Anaedo gawa ụlọọgwụ bụ ebe a nọ kwuo na ọ nwụọla site na mmerụ ihe ndị uweojii kụrụ ya n'azụ olu.
N'ihi nke a ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ji iwe na ọnụma malite ime ngagharịiwe n'ebe a kpọrọ 'Outer Ring Road'.
Ihe onyonyo ha tinyere na Facebook gosiri ebe ha na-eme ngaghariịwe a.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Onye na-anọchiteanya Naịjirịa na mba India bịara ka ọ kụjụọ obi ụmụ Naịjirịa mana ha jụrụ kwuo na ọ bụghị mbụ ụdị ihe a na-eme ha.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
"Anyị na-ezozi ezo"
Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwụrụ na ha niile nọzị n'ime ụlọ makana ndị uweojii na-achọ ndị ha ga-anwụchi.
Mana, ọ gakwara n'ihu kwuo na atọghapụla ndị niile anwụchiri na ngagharị iwe ahụ
"Ndi anwụchiri ụnyaahụ, atụghapụla ha. Ọ bụ Rupee 25,000 ka eji gbapụta ha. Ọ sị na nke ahu na-ewute ha makana ego ahụ buru ibu."
Ndị uweojii na-agọ n'aka ha adịghị n'ogbugbu a
Mana dịka ụlọ ntaakụkọ Hindustan Times siri dee, ndị uweojii India na-agọ n'aka ha adịghị na mkpa mkpa kpara.
Dịka ha sirị dee, ndị uweojii kwuru na nyocha ha mere gosiri na onweghi akpa dị nwa amadị a n'ahụ, ma kwuo na ọnwụ ya enweghi etu o siir metụta nzute ya na ndị uweojii nọ ọrụ na mpaghara ahụ ihe a mere.
Ha sị na Osote Onyeisi ndị uweojii na mpaghara India ahụ bụ Urvija Goel kwuru na ha na-eche mpụtara nyocha e mere n'ahụ nwa amadị a iji makata ihe gburu ya.
Oke mwakpo
Ihe onyonyo ụfọdụ ndị Naịjirịa bi India zitere BBC na-egosi ebe a na-awakpo ndị a na-eme ngagharị iwe dịka ndị uweojii na-anwụchi ha.
Ndị hụrụ oge ihe a mere na-akọwa nọ ọbụ ụfọdụ ndị India ndị nkịtị na-awakpo ndị a. Ihe onyonyo gosikwara ụfọdụ ndị bu ọbara n'ahụ nke gụnyere otu nwaanyi ọbara juru n'isi.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ụlọ ọrụ na-anọchịte Naịjirịa n'India mana ha azaghị ekwenti ha.
BBC kpọkwara Abike Dabiri-Erewa, bụ onye na-ahụ maka ọdịmma ndi Naịjirịa nọ ofesi mana ya onwe ya azaghị ekwentị ya.
Ọ ruola afọ asaa Leonard Eneonyia pụrụ
BBC Igbo mechara nwete nwanne nwa amadị a nwụrụ n'ekwentị o were nwa BBC na ọ bụ nnukwute Ọdacgi zutere ezinaụlọ ha.
Victor Ejike gwara BBC na ọ bụ afọ asaa Maazị Eneonyia pụrụ njem ma hapụ ezinaụlọ ya na Legọs.
Ọ sị na ọ na-akwado ịlọta Naịjirịa tupu ọnwụ na-erụghị erụ a ezute ya.
"Nwunye ya na ndi be ya nọ Legọs. Anyi na-ele anya na ọ ga-abata nso nso a makana ọ ka rụchara ụlọ na-achọzị ịbata."
Maazị Ejike gakwara n'ihu kwuo na ha amatabeghi etu nwanne ya siri zute ọnwụ.
"Ọtụtụ mmadụ na-akọ akụkọ banyere etu nwanne m siri nwụọ. Anyị amabeghị nke bu eziokwu. Ihe nke anyị ma bụ na o nwụru ụnyaahụ bụ Sọnde."













