Embassy Closure: Ihe ọ ga-emebiri ụmụ Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ụlọọrụ gọọmenti etiti na-ahụ maka ihe gbasara mba ndị Naịjirịa n'ofesi emechiela isi Obodo Naịjirịa dị na Serbia na Czech.
Akụkọ kwuru na ha na-agba mbọ ị chutu ndị mmadụ n'ọrụ n'isi obodo Naịjirịa dị na Ukraine.
Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mmekọ Naịjirịa na mba ofesi kpụrụ n'ala makana obughị ekwenti ya.
Anyị ga na-anwa ike anyị ịnweta ọnụ okwu ha.
Ihe mmechi ụlọ nnọchita ozi Naịjirịa na mba Czech na Serbia na-egosi
1)Ọ na egosipụta na ochịchị Gorment Naịjirịa a maghị ihe ha na eme
2)Nke a na-ezi kwa na nchekwa obodo anyi bu Naịjirịa dara onyụpa na egosipụta na otu ha si aur oru n'mba ndi ozo
3)ụmụ Naịjirịa nọ na obodo ndịa ga a nara akwukwo ikike njem obodo ọzọ ma ha chọrọ igbanwe akukwo visa ha.
4)Ndị ndu Naịjirịa ebughị ọ di nma ụmụ Naịjirịa n'obi
Ihe a turu anya kaarị Gorment Naịjirịa mee
1)Atụrụ anya na Gorment Naịjirịa kwesiri i nweta ndị ọru isi obodo nwere ikike ihu maka ihe gbasatara ụmụ Naịjirịa nọ na Mba ndịa
2)Ụlọ ọrụ a ga enwe ụbọchị ha ji aru ọrụ.









