Ụmụ Naijria nọ Switzerland na-eme ngagharịiwe na 'Nigerian Embassy' na mba ahụ

Ndị Naịjirịa nọ na Switzerland

Ebe foto si, Twitter/screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu kpọrọ onwe ha 'Nigerian Youth Movement' na mba Switzerland edegarala otu dị icheiche akwụkwọ ozi gbasara ihe ha kpọrọ "agwa ọjọọ" ụlọọrụ Naịjirịa dị na mba ahụ na-akpa.

Dịka ụlọ akụkọ Guardian siri kwuo, otu ahụ kwuputara nke a n'ozi ahụ ha degaara onye odeakwụkwọ gọọmentị Naịjiria, Ministrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ọzọ nakwa ụlọọrụ na-akwụsị mpụ bụ EFCC ha kpọrọ oku ha enyochaa ya bụ ụlọọrụ.

Iwe ha bụ na onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba ahụ bụ Baba Magudu nakwa Kemi Amuda na-arụrụaka, ma kwuo na mmadụ abụọ ahụ na-eji ndị uweojii amaja ụmụ Naịjirịa bi ebe ahụ.

N'ozi ahụ nke onye ndu ha bụ Ireydaer Omobude binyere aka ha sị,"Anyị na-akpọ oku ka a kpọghachi Baba Madugu na Kemi Amuda n'ala Naịjirịa n'ihi na ha anaghị achụ ọdịmma mba Naịjirịa nakwa ụmụ Naịjirịa na mba ahụ" ka ozi ha kwuru.

Otu ahu kwukwara na ha edebuola akwụkwọ ozi n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ a maka ofu okwu a mana ọ mịtaghị mkpụrụ

Cheta na onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa n'ofesi bụ Abike Dabiri gọrọ ebubo mmegbu ụmụ Naijiria nọ na Switzerland na-ebo ụlọọrụ Naịjirịa na mba Switzerland na mbido izu a.

Ihe onyonyo pụtaburu gosiri ebe ihe ndị e chere na ha bụ ndị uweojii mba Switzerland na-achụpụ ndị Naịjirịa bịara ịnata akwụkwọ njirimara onwe bụ "Passport" na Bekee n'ụlọọru nnochite Naịjirịa na mba Switzerland.

Onye sere ihe onyonyo ahụ kwuru na ọ bụ kemgbe ụtụtụ ka ha kwụ ebe ahụ na-eche ka mmadụ za ha mana ndị na-arụ ebe ahụ kpọọrọ ha ndị uweojii mba Switzerland ị bịa chụpụ ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mana Abike Dabiri esila n'akara Twitter ya zipụta ozi na-ekwu na ọ bụghị ndị uweojii na-achụpụ ndị mmadụ na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa na-agbalị ibute udo.

Dabiri kọwara na ọ bụ orịa Covid-19 mere ka e tinye iwu ịza naanị mmadụ iri kwa ụbọchị n'ụlọọrụ ahụ dị n'obodo Bern dị na Switzerland.

Akwụkwọ ikike njem Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Immigration Service

"Mmadụ 64 bụ ndị wujuru ebe ahụ ụbọchị ihe a mere mana naanị mmadụ iri n'ime kwadoro ka aza ha - ndị ọzọ akwadoghi tupu ha abịa".

"Mana ha niile gbalịrị iji ike wụbanye n'ime ụlọọrụ ahụ mgbe Baba Madagu bụ onye na-anọchite anya Naịjirịa na mba ahụ chọrọ ịgwa ha okwu nke mere ka a kpọọ ndị ọrụ nchekwa inye aka kwụsị ọgbaghara ahụ"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2