Ka oge e nyere ha gara, ndị Naijirịa tọrọ na Dubai na-arịọzi ka agbatara ha ọsọ enyemaka

Ebe foto si, Ashleigh Stewart/Twitter
Ndị Naịjirịa bi Dubai agwara BBC na ọkankụ ndị be ha tọrọ na mba ahụ na-arahụ n'ezi dịka ha ahụghị ebe ha ga-abanye.
Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ịfegharị na soshal midia banyere ọnọdụ ndị a.
'Ọtụtụ ndị Naijirịa enweghịzị ebe obibi'
Maazị Ifeanyi Ibe bụ onye Naịjirịa bi mba UAE kwuru na ọnọdụ ụfọdụ ndị Naijirịa bị n'ebe ahụ ugbu a adịghị mma.
Ọ kọwara sị "ọ bụ ndị akwụkwọ obibi ha emebiela maọbụ ndị na-enweghịzi ọrụ kacha ata ahụhụ".

Ebe foto si, @nidcom_gov
Maazị Ibe kọwakwara na ụfọdụ ndị biara njem nlegharị anya mgbe mmachị ọrịa coronavirus bidoro sokwa na ndị a tọro atọ.
O kwukwara na mba Dubai nyere ohere nke ha jiri kpọọla ndị Naijirịa ma kwụọrọ ha ụgwọ ụgbọelu buletara ha na-efu.
Ibe mekwara ka anyị ghọta na n'izuụka abụọ ọ gara mpaghara ụlọ nnọchịte anya Naijirịa na mba ahụ na ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ọgịge ụlọ ahụ achọ enyemaka gọọmentị ndị Naijirịa.
O kwuru na ọ bụ ndị mba Dubai na-enye ha mmiri na obere achịcha ha ji eleta onwe ha anya.
'Ụfọdụ ndị ụgwọ ụlọ ha agwụla ma ha enweghị ego ịkwụ ụgwọ ụlọ'
Onye Naịjirịa ọzọ aha ya bụ Chinedu Ichoku kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ ndi Naijirịa na ndịisi ojii ọzọ na-eme na Dubai soro ebute nsogbu a.
O kwuru na gọọmentị UAE enyela iwu ka ndị akwụkwo obibi ha mebiri site n'ụbọchi mbụ nke ọnwa Maachị ruo ụbọchị iri na asaa nke Ọgụstụ si mba ahụ pụọ.
Ichoku na-akọwa na ọ bụ ụlọọrụ Naijirịa bụ ndị kpọtara Airpeace ha ji akpọpụ ndị Naijirịa.
O kwukwara si: "ụfọdụ ndị a enweghịzị ebe ha bi nke mere na ebe ọbụla ha hụru ha arahụ.
Onye ntaakụkọ sị na ya hụrụ ndị Naịjirịa na-arahụ n'ezi
Onye ntaakụkọ nọ na Dubai aha ya bụ Ashleigh Stewart etiela mkpụ na ndị Naijirịa mmadụ iri atọ na ise tọrọ na mba na-arahụ n'ezi.
Stewart depụtara nke a n'akara twitter ya ebe o gosiri ndị o si bụ ndị Naijirịa ka ha na-arahụ ụra n'ọgige nlepụ anya dị na mba Dubai.
O kwuru na ụfọdu n'ime ha anọọla ebe ahụ ụbochị ole na ole ebe ụfọdụ anọruola izuụka atọ.
Ọ kọwara na ọ bụ otu ihe ka ha niile na-ekwu nke bụ na ụloorụ ha kwụsịrị ịkwụ ha ụgwo ọrụ nke mere na ha enweghịike ịkwụ ụgwo ụlo ha.
Stewart kwuru na ndị a gwara ya na ha arịọla gọọmentị Naijirịa ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ọ rịorọ ka ndị mmadụ gbatara ha ọsọ enyemaka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na gọọmentị Dubai wepụtara ohere ịkpọlata ndị Naijirịa akwụkwọ obibi ha gbajọrọ site n'ọnwa Maachị ụgbọelu na efu.
Ha kwuru na ọ bụ ugboro atọ ka ha ga-eme nke a ma kọwakwaa na ndị nke a metụtara nwere tutu ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgụst ịpụ UAE.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe gọọmentị Naijirịa kwuru
BBC kpọtụrụ Abike Dabiri-Erewa bụ onye na-ahu maka ndị Naijirịa bi n'ofesi ka otinye ọnụ na ya bụ ọkwụ.
Kama ugboro ugboro ole a kpọrọ ekwe ntị ya ma enweteghị ya. Ọ saghịkwa ozi BBC tinyere n'akara ekwenti ya.
Kama, akara Twitter ngalaba Dabiri-Erewa n'isi ya bụ nke Bekee kpọrọ "Nigerians in Diaspora Commission" dere na ndị Naịjirịa ikpeazụ tọrọ na mba Amerịka ga-alọta taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3









