FUTO students: Ụmụakwụkwọ FUTO tọrọ na Bosnia alọtala na Naịjirịa

Alexandro Abia na Kenneth Eboh

Ebe foto si, NIDCOM

Nkọwa foto, Alexandro Abia na Kenneth Eboh mgbe ha wuchiri n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụakwụkwọ FUTO abụọ ahụ bụ Alexandro Abia na Kenneth Eboh ndị mba Kroeshia tụlatara na Bosnia alọtala na Naịjirịa.

Onyeisi kọmiti na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi bụ Abike Dabiri site n'ozi o zitere BBC kwuru na ha batara ọdọụgbọelu dị n'Abuja n'abali Fraịde 20 Disemba, 2019.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ụmụaka akwụkwọ ndị a sị na ha gara isonye n'asọmpi Tennis na mba Kroeshia bụ ebe anwụchiri ha ma tụlata ha na mba Bosnia.

Dabiri dị na mbụ kwuo na minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Geoffery Onyeama banyere n'ọrụ ozugbo maka ịzọpụta ụmụokoroọbịa abụọ ahụ tọrọ na mba Croatia.

Dabiri kwukwara na agbanyeghị na Naịjirịa enweghị ọnọdụ na Croatia mana na ndi ọrụ ha nọ na mba gbara ha gburugburu abanyelarị n'ọrụ ịmata nke bụ eziokwu na ọnọdụ ndị ụmụokorọbịa ahụ.

Ụmụakwụkwọ abụọ nke mahadum tekịnụzụ (Federal University of Technology) dị n'Owere tọrọ na mba Croatia ebe ha gara asọmpi tenis.

Aha ụmụakwụkwọ a bụ Abia Uchenna Alexandro na Eboh Kenneth Chinedu.

Dịka akwụkwọ akụkọ Guardian UK si kwuo, Uchenna na Chinedu gara asọmpi a kpọrọ World Universities Championships.

Egwuregwu ha sonyere na ya bụ bọọlụ tebulu (table tennis)

Ha kwesịrị ịlọghachi na Naịjirịa n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba.

Abike Dabiri-Erewa

Ebe foto si, @abikedabiri

Mana ka ha na-eme obere mkpagharị na mgbede abalị iri na asaa nke Novemba, ndị uweojii mba Croatia nwụchiri ha.

Dịka Chinedu si kwuo, "Ha ekweghị ka anyị baa n'ime ụlọ anyị weta akwụkwọ ikike anyị ji mee njem."

"Onweghị onye kwere ịṅa ntị n'ihe anyị na-ekwu."

Ndị uweojii ahụ kpọrọ ụmụakwụkwọ abụọ a bufee ha mba Bosnia-Herzegovina.

Bihac Migrant camp in Bosnia and Herzegovina

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ogige dị na mba Bosnia-herzegovina ebe a na-edebe ndị mbịarambịara na-enweghị akwụkwọ zuru oke.

Ebe ahụ ka e nwere ogbe ebe ndị mbịarambịara na-enweghị akwụkwọ juru.

Mmiri adịghị ebe ahụ, ekpomọkụ adịghịkwa ya, na-agbanyeghị n'obodo ahụ na-atụ nnukwu oyi.

Ka ọdị ugbua, ụmụakwụkwọ abụọ a ka nọ na Bosnia-Herzegovina.

A mabeghi mgbe a ga-ahapụ ha ka ha lọghachi Naịjirịa.

Ihe ndị FUTO kwuru

BBC Igbo kpọtụụrụ Ọkankuzi Chikwendu Orji onye ji ọkwa 'Dean of Student Affairs' na Futo.

Mana o kwuru na ya agaghị asa ihe ọbụla n'ihi na ọbụghị ya ka ọ dị n'aka ikwuchitere mahadum ahụ ọnụ ya.

Okweghịkwa ezitere anyị akara ekwentị onye ọ bụ ọrụ ya ikwu okwu.

Anyị kpọtụkwaara ndi isi otu jịkọrọ ụmụ akwụkwọ bụ nke a kpọrọ 'Student Union Government'.

Mana ha kwuru na ha anụbeghi akụkọ a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: