Ihite Uboma unrest: Ụmụ ntorobịa iwe dị n'obi agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ maka onye otu ha e gburu n'Ihite Uboma, Imo steeti

Akụkọ na-eru anyị ntị n'ehihie a bụ na ụmụ ntorobịa Umuderim, dị n'Okpuruọchịchị Ihite Uboma dị n'Imo steeti ewerela iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'ebe ahụ.
Onye nta akụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ sị na ihe butere ya bụ ọkụ gbụgbụ bụ maka onye onye otu ha ndị uweojii gbagburu.
"Ndị uweojii nọ ebe ahụ riri mbọmbọ ọsọ ka ha hụrụ ụmụ ntorobịa ha ji iwe abia ebe ahụ"
Ọ dị ka nke ahụ ezughị, ndị nọ ebe ya bụ ihe mere kwuru umu ntorobia ndị ọzọ bịakwara soro ha gbawa ebe ndị ọzọ ọkụ.

Ha sị na 'agbara ụlọọrụ Isi okpuruọchịchị obodo dị ebe ahụ, ụlọikpe, ụlọọrụ na-ahụ maka ụlọakwụkwọ Praịmarị bụ "Local Education Authority " nakwa ụfọdụ ụgbọla.
Akụkọ ka na-abịa.





