Bende Police station: Mgbọ egbe merụrụ ndị uweojii ahụ na mwakpo ndị oji egbe mere na Bende

Ebe foto si, Ndị Bende
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa Steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC ndi uweojii abụo merụrụ ahụ dịka ndị ji egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ma gbaa ụlọ ọrụ ha dị n'obodo Bende ọkụ n'abalị.
Maazị Ogbonna sị na ndi bịara mwakpo ruru mmadu narị, nke ọ sị mere ndị uweojii ejighi nwee ike ịchụla ha.
Dịka o siri kọwa, ndị gbara ụlọ ọrụ ndị uweojii ọkụ ma gbakwaa ụgbọala onyeisi ndị uweojii na ọzọ ndị uweojii ji ọkụ.
Ihe ọzọ ha gbara ọkụ bu ọgbatụmtụm, ụlọ igwe ọkụ nakwa ụlọ nzukọ dị n'isi ulọ ọrụ okpuru ọchịchị Bende.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu ka si ebe ahụ pụọ tupu mwakpo a emee.

Ebe foto si, John Okiyi Kalu
Ikpeazu bịara ọgbakọ e mere maka ịnabata Nnenna Ukeje bụbu onye nnọchị anya mpaghara Bende na ụlọ omeiwu nta n'Abuja.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahu kọwara na ebe niile tọgbọọ chakoo dịka ndị agha anaghị achị ọchị ma chaa wujuru ụzọ niile.
Ụjọ ji ndị Bende

Onye ntaakụkọ BBC gara na Bende ebe ya bụ ihe mere ka o were anya ya hụrụ etu o si mee.
Oge ọ garuru, ọ chọpụtara na ebe niile dịka ebe a gbara ọsọ, n'ihi na ndị mmadụ ka na-atụ egwu na ndị ọrụ nchekwa nwere ike ịba kpụkọrọ ha niile n'ihi mwakpo ahụ.
Na mbụ, onye ntaakụkọ anyị enweghị ike ịbanye n'ogige ndị uweojii ahụ a gbara ọkụ n'ihi na ndị agha Naịjirịa ewerela ọnọdụ ebe ahụ.
Mana ha mechara hapụ ya ka ọ banye ma see foto etu ebe ahụ dịzi ugbua.
Ben Nwabueze, onye obodo Bende, gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri mmadụ atọ n'ụtụtụ taa ma kpụrụ ha pụọ.
"Ọ bụ ya mere ụjọ ji jide ndị mmadụ maka na anaghị agwa ochi ntị na agha esula," Nwabueze kwuru.
Onye ọzọ bụ Chioma Oleka gwakwara onye ntaakụkọ BBC na ụfọdụ ndị be ha na-apụ n'isi ụtụ ịga chọọ ihe afọ ga-eri, mana onweghị onye ụjọ kwere pụọ n'ụtụtụ taa maka adịghị ama ama.
Onye ntaakụkọ anyị chọpụtakwara na ndị ọrụ nchekwa emechia okporoụzọ ebe ụlọọrụ ndị uweojii ahụ dị, ha anaghị ekwe ka ụgbọala ọbụla si ya bụ ụzọ.
Ndị mmadụ na-agbazị ụzọ Ohafia maọbụ Arochukwu, ebe ndị ọzọ na-ezi ụzọ Uzuakoli, Isikwuato nakwa Igbere.














