Ihe ndị oji egbe na-eme agaghị akwụsị anyị ịrụ ọrụ - Uweojii Anambra

Ebe foto si, Anambra State Police
Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ M.B kuryas sị na mwakpo niile ndị oji egbe na-awakpo ha agahị eme ka ha daa mba n'ọrụ.
O kwuru nke a ma kwee nkwa na ndị uweojii ga-echekwa ndụ na akụnaụba ndị Anambra Steetị.
Kuryas dọrọ ndị na-akpa arụ aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ, kwuo na aka ga-akpara ha n'oge na-adịghị anya.
Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenganyia wepụtara.
Nyere anyị aka chọpụta ndị na-awakpo anyị n'Anambra - Uweojii

Ebe foto si, Getty Images
Tochukwu Ikenganyia bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara akọwarala BBC Igbo etu ndị oji egbe amabeghị ndị ha bu jiri wakpo ma gbuo otu oye uweojii na steeti ahụ na Toozde.
Ikenganyia sị na ihe a mere bụ nnukwu ihe metụtara ndi uweojii n'Anambara steeti.
Ọ sị; "Ọ bụ dịka elekere anọ nke ehihe ka ndị wakporo ndị otu anyị nọ mgbakọ ụzọ Ọkacha dị na Neni nke okpuru ọchịchị Anaocha."
Ikenganyia sị na ndị a ji ụgbọala Sienna na ọgba tum tum malitere ịkwa mgbọ dịka ha rutere ebe ndị uweojii ahu nọ arụ ọrụ nchekwa.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
"Ndị, omekome gafere 20 ji ụgbọala Sienna atọ na ọgba tum tum na ndị uweojii kwara mgbọ ruo nkeji iri atọ tupu ndị uweojii ndi ọzọ gbata inyere ndị otu aka ndi omekome a were gbaa ọsọ."
Mana, ọ si na ndi uweojii abụọ merụrụ ahụ, nke otu onye n'ime ha mechara nwụọ n'ụlọ ọgwụ.
DSP Ikenganyia sị na ya amachabeghị etu mwakpo nke mere na Awkuzu siri mee mana ya ma na ọ bụ ndị agha mmiri ka nke ahụ metụtara.
Akụkọ si Awkuzu dị n'okpuru ọchịchị Oyi pụta kọwara na ndị agha mmiri ruur atọ nwụrụ dịka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ha.
Mwakpo na-ewete ya nke ole ma ole mere kemgbe ndị mmadụ malitere iwakpo ndị uweojii na ndị agha n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe n'ọnwa Ọktoba nke 2020 dika a na-eme ngagharị iwe EndSars.
Mwakpo bukwa akara mwakpo ndị nke mere n'Ọnwa Jenụwarị nakwa Febụwarị n'Anambara, Imo, Abia, nakwa Akwa Ibom.
Akara na-abukwarị igbo ndị ọrụ nchekwa na buru ngwa agha ha gbalaga.
DSP Ikenganyia rịọrọ ndị Anambara arịrịọ ka ha gbanye ndị uweojii aka n'ukwu ka a hụ na mkpa mkpa kwụsịrị.
BBC kpọrọ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na Anambara bụ Don Adinuba mana ọ sị na ya enetebeghi ozi banyere ihe a mere.












