Igbo ndị ọma ka anyị wụsa ọwa ebe n'ụbọchị taa
Echi ka anyị chụọ n'owere nchi. Daalụ nụ.
Mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii Unueke, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọtụ n'Ebonyi steeti.
Chioma Obianinwa
Echi ka anyị chụọ n'owere nchi. Daalụ nụ.

Ebe foto si, Samuel Ortom/Facebook
Gọvanọ Benue Steetị bụ Samuel Ortom edopula onwe ya iche mgbe ya na onye bu ọrịa coronavirus nwechara mmekọ.
Osote ya bụ Benson Abounu mere ka ọha mata nke a n'ụbọchị Sonde na onyeisi ya bụ gọvanọ Ortom abanyela n'ọnọdụ idopu onwe iche.
Nke a ga-abụ ugboro abụọ ọ ga-edopu onwe ya iche kamgbe ọrịa a tibatara isi na Naịjirịa n'ọnwa Febụwarị afọ 2020.
Gọvanọ Ortom dopuburu onwe ya iche n'ọnwa Julaị, 2020 mgbe nwunye ya, nwa ya na ndị enyemaka nwunye butechara ọrịa coronavirus.

Mmadụ iri na asaa na-eme njem n'okporoụzọ si Abuja na-aga Keffi anwụọla mgbe ihe mberede mere n'agbata okpuruọchịchị Gudi na Akwanga dị na Nasarawa Steetị n'ụbọchị Satọde.
Onyeisi ndị ọrụ eje alọ n'okporoụzọ n'Akwanga bụ Ebere Onyegbaduo mere ka ndị ntaakụkọ Channels TV mata nke na Sọnde.
Ọ sị "anyị natara ozi banyere ihe mberede mere n'elekere asaa nke abalị n'obodo Agwada dị n'etiti Akwanga na Gudi".
"Anyị ji ọsọ gaa ebe ahụ ma hụ ka ụgbọala Bus na ụgbọala Sienna nke ndị mmadụ juru n'ime ya na-ere ọkụ. Anyị kpọrọ ndị mgbanyụ ọkụ ha bịa menyụọ ọkụ ahụ n'elekere 11pm, anyị e buru ozu ha gawa n'ụlọ ozu n'elekere 2am."
Ebere gara n'ihu kwuo na nyocha ha mere gosiri na ụgbọala bus a si Abuja chọrọ ịgbafe otu ụgbọala na mkpọda ugwu nke mere ya na ụgbọala Sienna ji sọkata isi ma nwuru ọkụ.
Ọ sị na eburula ozu ndị a gawa n'ụlọozu dị n'ụlọọgwụ Akwanga nakwa ụlọọgwụ Dalhatu dị na Lafia.
Gere nchịkọta akụkaọ ihe ndị mere n'ụwa n'otu nkeji.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjirịa a kpọrọ 'Immigration' agbaala ọkụ n'isi ụtụtụ ụbọchị ụka.
Nke a dị n'ozi ụlọọrụ a wepụtara n'akara twitter ha sị na ọkụ gbara ụfọdụ mpaghara ụlọọrụ ha mana ha emenyụọla ya.
Ha sị na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na ndị ọzọ nyeere ha aka mmenyụọ ọkụ a.
Ha sị na-agbanyeghi ọkụ a gbara, na ọ gaghị egbochi ha arụla ọrụ ha kwesịrị ịrụ.
A mabeghi ihe kpatara ọkụ a ji gbaa n'ụlọọrụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Paul Adefarasin Twitter Page
Onyeisi nchuaja ụlọụka 'House on the Rock', Paul Adefarasin egosila nwute ya maka ọnwụ otu onye ụkọchukwu ya bụ Yinka Akinbami nwụrụ site n'ọrịa covid 19.
Adefarasin kwuru na ọnwụ ụkọchukwu a wutere ya nke ukwu makana ọ rụọla ọrụ n'ụlọụka ya ruo afọ iri ise.
O jikwa ohere a rịọ ụmụ Naịjirịa ka ha ghara ineli mkpa mkpa covid 19 na-akpa n'ụwa niile ma soro usoro niile ewepụtara iji igbochi mfesa ọrịa ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

Ebe foto si, Loveth Odah
Mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo n'isi ụlọọrụ ndị uweojii Unueke, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọtụ n'Ebonyi steeti.
Akụkọ kwuru na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii ebe elekere iri nke abali Fraide.
Ndị ha gburu gụnyere ndị uweojii nwoke abụọ na otu onye uweojii nwaanyị. Ha zukwara egbe abụọ n'ebe ahụ.
DSP Loveth Oda bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ kwetere n'ọdachị a mere ma kwuo na ebugala ozu mmadụ atọ ahụ ndị omekome gbagburu ụlọ ozu nakwa mmadụ abụ ọ meruru ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Reuters
Ndị Indonesia ekwuola na ha chọtala ebe ha na-eche na ụgbọelu Boeing 737 bụ ọtụtụ mmadụ kpọkasiri n'ime oshịmiri nwa mgbe nta o fepuchara n'isi obodo Jakarta n'ụbọchị satọde.
Ụgbọelu ahụ bu mmadụ iri isii na abụọ mgbe anya ahụghịzi ya n'ogbe nyocha dịka o ji nkeji anọ fepu mgbe o na-eje obodo Pontianak dị n'ogbe West Kalimantan.

Ebe foto si, frsc twitter page
Ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) na Naịjirịa ekwuola na site n'agba nke abụ nke afọ 2021, onye ọbụla ga-egosiriri akara NIN(National Identity Number) ya tupu o nweta akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala maọbụ idenye ihe nile gbasara ụgbọala ya n'akwụkwọ ndị FRSC.
Onyeisi FRSC bụ Dr Boboye Oyeyemi depụtara nke a n'akara twitter ngalaba ahụ ma na-ekwu na iwu a si n'aka ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
A chọpụtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ otu puku, narị ise, iri asatọ na ise na Naịjirịa ụnyahụ bụ ụbọchị Jenụarị 10,2021.
Anambra ketere mmadụ iri abụọ na abụọ, Ebonyi ketere mmadụ iri na isii ebe Abia ketere mmadụ anọ.
Lagos kachaa n'ọgụgụ dịka ha chitara narị ise, iri asaa na atọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nke onye chiri, ya zere.
Nnọọnụ!

Ebe foto si, LAS Police
Kọmishọna uweojii na Legọs Steetị bụ Hakeem Odumosu nọọrọ n'isi ụtụtụ ụbọchị satọde 9 nke ọnwa Jenụwarị nwụchie ndị na-agba oringo maka ịda iwu na-achịkwa coronavirus.
Odumosu kpọ ndị uweojii ya baa n'otu ụlọ oringo a kpọrọ Lounge 38' dị na Bode Thomas nke Surulere, n'elekere otu nke isi ụtụtụ ma nwuchie ọtụtụ mmadụ na-agba oringo ebe ahụ.

Ebe foto si, LAS Police
Ha gakwara n'hu nwụchie ndị ọzọ nọ n'ezi na Maryland n'ime abalị ahụ dịka ha dakwara iwu onye apụla n'ezi nke gọọmentị tinyere site n'elekere 12am ruo 4am.
Ọ ṅụrụ iyi ime ihe niile o kwesịrị iji hụ na ndị bi na Legọs rubereisi n'iwu ndị e tinyere iji gbochie mfesasị ọrịa coronavirus.

Ebe foto si, Godwin Obaseki/Facebook
Atụmatụ ịchụtu Gọvanọ Godwin Obaseki nke Edo steeti n'ọkwa maka ebubo na o ji asambodo adigboroja zụo ọkwa ya kpụru afọ n'ala n'ụbọchị Satọde.
Ọkaikpe Ahmed Mohammed si na ahụghị akaebe na ebubo ahụ pati All Progressives Congress (APC) na otu onye aha bụ Williams Edobor boro Obaseki.
Maazị Edobor na APC gbara Obaseki akwụkwọ n'ụlọikpe sị na asambodo o nyere ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ "Independent National Electoral Commission" (INEC) iji zụọ ọkwa gọvanọ abụghị nke ezie.
Obaseki gọrọ na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ọkaikpe Mohammed kwenyere na-arịọ Obaseki ka atufuo ya bụ ikpe.

Ebe foto si, Nigerian Police
Obere nwata dị afọ ise a na-achọ achọ kamgbe ụbọchị ise gara aga ka a hụrụ ozu ya n'Ishiuzor dị n'Egbu nke Owere Imo Steetị.
Onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na a hụrụ ozu nwata ahụ n'ime otu ogbe ebe e dunyere ga-azụta mmiri ọṅụnụ.
Ọ sị na mgbe e dunyere nwata a n'ebe ahụ ịzụta mmiri, na ọ lọtaghị nke mere e ji na-achọ achọ mana ahụghị ya.
Mana e mechara hụ ozu ya dịka ụbọchị ise gachara n'ụlọ ebe ahụ a sị ya ga-azụta mmiri ọṅụṅụ (Sachet water).
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeokwu, ọ sị na nke a bụ eziokwu na ha ka na-eme nyocha etu mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ.
Ọ gakwara n'ihu sị na a nwụchiela di na nwunye na-ere ihe n'ụlọ ebe a hụrụ ozu nwata ahụ.

Ebe foto si, GM FIKRI IZZUDIN NOOR
Ụgbọelu Boeing 737 nke ụlọọrụ Sriwijaya mmadụ iri isii na abụọ si Jakarta na-aga Pontianak dị na mpaghara Kalimantan nke mba Indonesia sọnyere isi n’osimmiri ma gbawa ka ogbunigwe n’ụbọchị Satọde.
A malitere ịchọ ụgbọelu a achọ n’ime nkeji anọ o si n’ọdọụgbọelu dị na Jarkata fepu.
Ọba ịntanetị nke Flightrader24.com sị na ụgbọelu a dara ihe ruru metre 3000m n'ime otu nkeji.

Ebe foto si, MULYONO/NAKI
Anya hụrụ ka ihe ji mee sị ha hụrụ ma nụ ụda ogbunigwe.
Ọkụazụ Solihin nyere aha ọzọ gwara BBC Indonesia ma ọ hụrụ mkpọkasịa ebe onye ndu ha n'ụgbọmmiri kpebiri ka ha laghachị n'elu ala.
Ndị bi n'ala dị n'etiti mmiri dị nso n'ebe ihe a mere gwara BBC na ha hụrụ ngwo ngwo ndị dịka ha si n'ụgbọelu ahụ pụta.

Mịnịsta na-ahụ maka njem na mba ahụ sị na ndị ọrụ gbatagbata azụpụla njem ịchọpụta ndị a.
Ebe ndịagha ụgbọmmiri sị na ahụla ụkpụrụ etu ụgbọelu ahụ si fee ma zipu ụgbọmmiri ha n'ogbe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka mgbasa ozi nakwa akụnaụba tecknụ bụ Isa Pantami ekwuola na atụmatu idenye aha na akara njirimara a kpọrọ National Identification Number na Naịjirịa nwereike gbanwee ma ya bụrụ na gọọmentị tinyere mmachi ngagharị maka covid-19 ọzọ.
Dịka o siri kwuo, ngalaba ya na ụlọ ọrụ "National Identity Management Commission" nakwa ụlọ ọrụ ekwentị ga-ezute maka ịgbanwe atụmatụ ime ka akara NIN banye na cardị SIM ma ya bụrụ mmachi ngagharị ọzọ mere.
Ọ bụ na ụlọ ntaakụkọ Channels Television ka Pantami kwuru nke dịka ha na-agba ya ajụjụ ọnụ.

Ebe foto si, Google
Ụmụaka iri amụrụ ọhụrụ nwụrụ ka ọku bara ụlọ dị n'India n'ụtụtụ Satọde.
Azọpụtala ụmụaka asaa tupu ndị ọrụ itunyu ọkụ rute ụlọ ọgwụ ahụ dị na mpaghara Bhandara nke steeti Mhaarashtra dị na ọdịda anyanwụ India.
Aka na-achị India bụ Narendra Modi sị na ihe mere "na-agbawa obi".
Amabeghị ihe kpatara ọku a mana amalitela nnyocha.
Ọ bụ n'elekere abụọ nke ụtụtụ ka ọkụ a malitere, dịka ndị isi ụlọ ọgwụ siri kwuo.
Ndị ntaakụkọ siri na atụmatụ ịzọpụta ndị mmadụ ka kwụsịtụrụ maka ihe na-agba ka ogbunigwe n'ime ụlọ ọgwụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndi agha mba Congo iri abụọ na atọ eboro ebubo na aka ha dị na ogbugbo aka na-achịbu mba ahụ bu Laurent Kabila n'afọ 2001 enwetela mgbaghara.
Ọ bu onyeisiala mba ahu bụ Félix Tshisekedi bụ onye were ọchịchị n'aka nwa Kabila nyere iwu ka atụhapụ ndị agha na nga ka ha nọrọ afọ iri abụọ.
Kabila enweghi ịtụhapụ ndị eboro ebubo na ha gburu nna ya oge o na-achị mba ahụ.
Mmadụ 11 n'ime ha nwụrụ na nga.

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ nke Bekee kpọrọ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC) sị na nnyocha gosiri na mmadụ otu puku na narị ise na iri anọ na anọ ọzọ ebutela nje coronavirus.
Nke a wetere ọnụọgụgụ ndị buterela nje na mba ruo puku iri itoolu na asaa,narị anọ na iri asaa na asatọ.
Mmadụ otu puku na nari atọ na iri anọ na abụo anwụrọla site na nje ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọ ọrụ Twitter amachiela akara Onyeisiala Donald Trump nke Amerịka.
Nke a na-abịa ka ha gbaghere akara ahụ dịka ha gbachichara ya ruo otu ụbọchị.
Ha sị na ihe mere ha jiri mee nke a bụ ịhụ na Trump ejighi akara ahụ kwanye ndị mmadụ ka ha ga mee ọgbaghara n'obodo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Dịka Trump bụ onyeisiala Amerịka o ka nwereike iji akara onyeisiala Amerịka dee ihe.
Trump ejiriala akara nke ahụ zie ozi ozugbo ozugbo mana Twitter wepuru ya.