South East News: Ihe mere na o nweghi onye na-akatọ ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ?

South East News

Ọ bụzighi akụkọ ọhụrụ maka etu ọghaghara si ada na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe ngwụcha afọ 2020 rute ugbua.

Ọ na-abụzi chi bọọ a nụ ọzọ dịka ndị oji egbe na-awakpọ ụlọọrụ gọọmentị gụnyere ụlọọrụ ndị uweojii na ụlọọrụ Independent National Electoral Commision (Inec).

Nke a ebutela ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ịla ọtụtụ ụlọ na akụnaụba n'iyi ma tinye egwu na ndụ ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

South East News

Ihe na-atụ anya bụ na kamgbe ihe mkpamkpa ndị a malitere, onweghi ndị maọbụ otu sepụtara isi katọrọla ya.

Kama ihe ọtụtụ ndị nkịtị na-eme bụ ị na-ekele ndị oji egbe a maka "ọrụ ọma" ha na-arụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Cheta na ndị Igbo tụrụ ilu sị "ọ bụrụ na ihe ọjọọ gbaa afọ, ọ bụrụzie omenala".

Ya mere ọ dị mkpa ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndịisi okpukperechi, ndị eze ọdịnala na ndị nwere agba n'Ọwụwa Anyanwụ pụta ma katọọ mwakpo a na-eme n'obodo.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Maka na ọ dị mma "iwepu aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ".

Ọ bụ eziokwu na o nwebeghi onye maọbụ otu pụtarala kwuo na aka ha dị na mwakpo niile a mana ụfọdụ otu na-achọ nwereonwe site n'aka Naịjirịa.

Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu maka mkpa mkpa na-eme n'ala Igbo

Okaiwu Goddy Uwazurike na-ekwusike na ihe mere o ji dịka agbara nkịtị maka mkpa mkpa na-akpa n'ala Igbo bụ na ọ bụghị ndị Igbo na-awakpo mpaghara ọwụwa anyanwụ ugbua.

O kwukwara n'onyonyo na-efegharịnụ na soshal midia ebe ndị Igbo na-eto ndị oji egbe n'Owerri pụtara na ndị Igbo nabatara onye ọbụla na-akpagbu ndị uweojii na-emegbu ha.

Uwazuruike kwuru na ihe ọzọ mere ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo ji gbaa nkịtị maka oke wakpo na-eme na mpaghara ahụ ugbua bụ ụjọ na onyeisiala Naịjirịa nwerike ịnwụchi ha ma ha kwuo maka mkpa mkpa ahụ.