#TwitterBan: Etu VPN ga-esi nyere gị aka ịbanye na 'Twitter' nakwa 'Facebook' gị

VPN

Ebe foto si, Getty Images

Dịka gọọmentị Naịjrịa machiri Twitter ụbọchị Frịade, ọtụtụ na-atụ ụjọ ma Twitter ha aga esizi otu a nwụọ.

Ọtụtụ mmadụ ekwuola uche ha gbasara ya bụ Twitter gọọmentị Naịjirịa machiri nke bụ na ọtụtụ na-achọzị ụzọ ọzọ ha ga-esi abanye ya bụ ọba nzikọrịta ọzị.

VPN malitekwara iwu dịka ụzọ ndị mmadụ ga-esi abatakwa na Twitter.

Gịnị bụ VPN?

Virtual Private Network (VPN) bụ ụzọ ọwara intanet nke e nwere ike ịmepere otu onye (private network) n'ime ọwara intaneti nke ọha (public network).

Ndị ọkachamara gbasara intanet na-ekwu na ya bụ ọwara okporo ịntaneti nwere ike inye mmadu ohere isi ọwara okporo intanetị obodo ọzọ were banye Twitter maọbụ Facebook.

VPN dịka agada gbachiri ụzọ anaghị ekwe ka amata obodo mmadụ sị abata obaozi ịntanetị maka o nwere ike inye mmadụ ohere is akara Ip obodo ọzọ nwere banye na intanetị.

Onye o bụla nwere ike ibudeta (download) VPN na ekwenti ya maka nke a.

Ihe egwu dị na iji VPN

Ndị ọkachamara a na-ekwu na VPN abụghị ọwa okporo intaneti otu onye.

"Ọ bụ nke ọha".

Ọtụtụ mmadụ nwere ike iso ya otu mmgbe na-abe na Twitter.

Nke a nwere ike ime ka ndị ọjọọ ịntaneti wakpo onye ahụ.

Ọ bụrụ na ndị nwe ya bụ VPN bu ihe ọjọọ n'obi, ha nwere ike isi ebe ahụ tinyere gi nje mgbaama na kọmputa maọbụ ekwenti gị nke ga-enye aka izu gị ohi maọbụ mebie gị ihe.

O nwere VPN ndị ana enye n'efu, mana ọ bụ ụdị ndị a ka ihe egwu dị otu a karịrị na ha.

O nwekere ụfọdụ ana ere ere bụ nke ga-efu gị nwa ego.

Ndị a ka mma karịa ndị a na-enye n'efu.

Aha onyonyo, I nwereike ?hap? soshal midia n'otu ?b?ch??