Enugu communal clash: Etu ọtụtụ mmadụ si nwụọ n'ọgụ obodo Awha na Oyofu, Enugwu steeti

Ndị ntorobia Awha dị n'Enugwu

Ebe foto si, Chukwuebuka Ozonnaeme

Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgụ dapụtara n'etiti obodo abụọ bụ agbataobi; ndị Awha-Imezi na ndị Oyofu dị n'Ọkpuru Ọchịchị Ezeagu, Enugwu steeti n'ihi esemokwu ala.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na esemokwu ahụ malitere ụbọchị Tozde rue Satode dịka ndị e chere bu ndị Oyofo bu ụgbọala na-akụrị ala gaa kutusịa ma mebie 'blọck' nke onye Awha-Imezi nwere ụlọọrụ ya n'agbata ha na ndị Oyofo.

Nke a butere ọgụ tara isi mmadụ ole a mabeghị ọnụọgụgụ ha n'akụkụ abụọ ahụ na-alụ ọgụ, ebe ndị ọzọ merụrụ arụ, e buga ha ụlọọgwụ a kpọghị aha ya.

Ihe ndị Awha na-ekwu

Otu okenye onye Awha-Imezi achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na

"Ndị obodo Oyofo bu katapila mebiwe ihe ndị be anyị."

"Ụmụ okorobia be anyị sịrị ha pụta na ha agafeela okeala mana ha egeghị ntị."

"A bawazia mba lụwa ọgụ."

"Ha gbaturu nwa be anyị, ndị be anyị ekweghịzị."

" Agbarịtawa onwe ha, agbagbukwa ndị nke ha , mecha kwagbukwa ndị be anyị ọzọ."

Okenye ahụ, onye kwuru na ha na ndị Oyofo nweburu esemokwu ala dịrịla ọtụtụ afọ, rụtụrụ aka mbọ ndị ndu otu jikọrọ obodo gbara ka ndị ọrụ nchekwa gboo ọgụ ahụ tupu ọ dapụta amịtaghị mkpụrụ.

Ọ sịrị, "Ndị ndu otu jikọrọ ndị obodo anyị (town union) gara kpọ ndị agha mana ha azaghị ha sị ha gakwuru ndị uweojii, ha ekweghị abịa."

"Ọ bụ mgbe ndị uweojii nụzịrị na-agbatuola mmadụ ka ha ji bịa."

Ihe ndị Oyofo na-ekwu

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'aka nke ọzọ, okenye obodo Oyofo kwuru na, "Ha(ndị Awha) gara ebe ndị ntorobia anyị ji katapịla ekpochasị ebe otu ọgbọ ga-arụ ewumewu obodo, wakpoo ha, gbuo mmadụ anọ."

"Ka o ruru na mgbede ha jiri ndịagha laghachi, ndịagha bịara nwụchie ụfọdụ ndị ntorobia obodo anyị."

" Ha gburu anyị ga kpọta ndị uweojii na ndịagha bịa na-anwụchi ndị ntorbịa obodo anyị tinye ha n state CID."

Okenye Oyofo ahụ, onye boro ebubo na ndị Awha bụ ndị mbịarambịara si Anambra steeti bịa obodo ha oge gboo, ndị nnanna ha nye ha ala na ndagwurugwu obodo ha.

Okenye ahụ onye sịrị na ha nyekwara ndị obodo Awha ebe ha lụrụ ụlọakwụkwọ na ụfọdụ ewumewu ndị ọzọ n'elu ala, boro ebubo na ha mechara hapụ ebe e nyere ha, bịa n'elu ala akpakọrọ ala ndị Oyofo.

Ọ gara n'ihu rụtụ aka na Ụlọikpe Kachasị ekpela ma bie yabụ ikpe.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọnụ ndị uweojii Enugwu steeti n'okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe asaghị ozi e zigaara ya n'ekwentị oge e wepụtara akụkọ a.

Nchọpụta BBC gosiri na obodo abụọ ahụ enweela esemokwu ala a kemgbe ọtụtụ afọ.

Esemokwu ala ahụ agaala ụlọikpe, ebe gọọmentị, ndị eze ọdịnala nakwa ndị ndu ụka agbaliala idozi okwu a mana ya bụ okwu ebibeghị.