Ebonyi Communal Clash: Ihe mere obodo na ibe ha ji alụkaarị ọgụ na steeti ahụ

Ọgụ dapụtara n’etiti obodo Abaomege na Ishinkwo nke Ebonyi steeti n’ụbọchị tara isi mmadụ abụọ ebe otu onye uweojii merụrụ ahụ.
Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ mgbe ụdịrị ọgbaghara na-adapụta n’etiti obodo na ibe ya na steeti ahụ kamgbe ọtụtụ afọ.
N’ihi ya, akụkọ a ga-eleba anya n’ụfọdụ ihe ndị na-ebutekaarị tigbuo zọgbuo n'ụfọdụ n’Ebonyi steeti.

Gịnị na-ebutekaarị ọgụ obodo na ibe ya?
Otu nwafọ Ebonyi steeti na-achọghị ka a kpọọ aha rụtụrụ aka na ụfọdụ ihe ndị na-ebutekaarị ọgbọghara n’etiti obodo na ibe ya na steeti ahụ.
O kwuru na ọgụ na-ada n’etiti ụfọdụ obodo na steeti ahụ abụghizi ihe a na-ekwu n’ọnụ maka na ọ taala isi ọtụtụ mmadụ nakwa laa akụnaụba n’iyi.
“Otu ihe gbapụtara ihe na-ebutakaarị ọgụ obodo na ibe ya bụ ịzọ okeala ọkachasị ndị dị n’etiti obodo ndị a.
“Nke a na-akawanye njọ n’oge udummiri, mgbe ndị mmadụ na-arụsi ọrụ ugbo ike.
“Ebe obodo ndị na-azọ onye nwe okeala ndị a, ọgụ ga-adapụta ọkachasị n’etiti ndị ntoroọbịa nke na-ebute ogbugbu ndị mmadụ nakwa mmebi ọtụtụ akụnaụba.”
O kwuru na ihe ozọ na-ebute ọgụ a bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka na ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eji ohere ahụ akwanye ọkụ n’etiti ndị ntoroọbịa obodo na ibe ga iji zọta ọkwa ha na-achọ.
“Ọtụtụ ndị agbala ọsọndụ si n’obodo ha pụọ dịka ha a gbara ụlọahịa ha, ụlọ obibi ha nakwa akụnaụba ndị ọzọ ọkụ n’oge ọghaghara ndị a.
O kwuru na ihe ndị ọzọ nwereike ibute ọgbaghara gụnyere; ịzọ onye ga-abụ onyendu n’obodo, ịzọ onye ga-abụ onyeisi ọdọụgbọala dgz.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọgụ a abụghị naanị n’etiti obodo dị n’Ebonyi steeti, na mgbe ụfọdụ ọ na-abụ n’etiti ha na steeti ndị gbara ya gburu gburu gụnyere Benue, Cross River na ndị ọzọ.
Obodo ndị na-alụsokaarị onwe ha ọgụ

- Ụfọdụ obodo ndị ọgụ dapụtarala n’etiti ha n’ihi okeala, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ gụnyere;
- Obodo Ezza na Effium dị n’Ebonyi steeti
- Obodo Ezza na Ezzilo dị n’Ebonyi steeti -
- Obodo Ikwo na Izzi nke Ebonyi
- Obodo Ishinkwo na Abaomegenke Ebonyi steeti – Ọgụ dị n’etiti ndị a malitere kamgbe ma na-aga n’ihu ruo ugbua. N’ụbọchị 06 Juun, 2023 e gburu mmadụ abụọ ma merụọ otu onye uweojii ahụ.
- Obodo Ngbo nke Ebonyi steeti na Agila nke Benue steeti – Akụkọ kwuru na ọgụ dị n’etiti obodo abụọ ndị akarịala afọ iri ise, ihe karịrị mmadụ narị atọ anwụọla site n’ọgụ a. N’afọ 2021 a hụrụ ozu mmadụ iri abụọ na-enweghi isi na Ngbo.
- Obodo Amagu nke Ebonyi na Adadama na Cross River steeti - Ọgụ malitekwara ọtụtụ afọ gara aga nke mere n’afọ 2016 e gburu mmadụ ruru asatọ n’ihi ya.
- Obodo Izzi na Ukelle nke Cross River steeti – Ọgụ a bụ nke malitere n’ihi ịzọ okeala ataala isi ọtụtụ mmadụ n’obodo abụọ ndị a.

Ihe e merela iji gboo nsogbu ọgụ a?

Ebe foto si, Nigerian Police
Ọtụtụ oge ka gọọmentị etiti nakwa nke steeti Ebonyi, Benue na Cross River na-eme ọtụtụ ihe iji hụụ na e gbochiri ọgụ a.
Ihe ndị ha na-eme gụnyere;
- Ihiwe kọmitii ga-eleba anya na n’ihe butere ọgụ a ma gbọọ ya
- Ịnapụ obodo abụọ ndị na-alụ ọgụ okeala ahụ mere ha jiri alụ ọgụ.
- Ngalaba gọọmenti Naịjirịa na-ahụ maka okeala abịala ọtụtụ oge ikewa okeala ahụ dị n’etiti obodo abụọ ndị na-alụ ọgụ.
- Nke ọzọ bụ ihiwe ogige ndịagha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n’okeala ebe ahụ a na-azọ azọ iji weta nchekwa ma belata ọgụ a.
N’ime mbọ niile a gọọmentị gbarala, ọ dị ka a ga-asị na ọgụ dị n’etiti ụfọdụ obodo ndị a achọghị ịkwụsị akwụsị.









