Ndịagha Naịjirịa ọ wakporo obodo Akpawfu, Enugwu? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Nigerian Army/BBC
Ndị bi n'Obodo Akpawfu dị na Nkanu East, Enugwu Steeti na-agba aghara aghara ugbua dịka akụkọ na-ekwu na ndịagha Naịjirịa wuchiri n'obodo ahụ kamgbe ụbọchị atọ gara aga.
Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ya bụ ihe malitere n'ụbọchị Fraide 14, Ọktoba 2023 mgbe oge ndị agha jị ụgbọala nakwa ụgbọelu wakpoo n'oke ọhịa dị n'Akpawfu akpọrọ 'Agụ-Udene'.
Akụkọ kwuru na ha na-achọ ebe nzuzo ndị otu nchekwa Eastern Security Network (ESN) nke otu Indigenous People of Biafra (IPOB) hiwere.
Otu nwaokoroọbịa obodo ahụ gwara BBC Igbo sị "ọ bụ na Fraịde ka ndịagha ji ụgbọelu helikọpta na agba egbe n'ime ọhịa obodo anyị bụ Agụ-Udene, nke mere ndị mmadụ si n'ụlọ ha gbaa ọsọ.
"N'ụbọchị ahụ ahịa obodo Akpawfu bụ Ikoro mechiri emechi maka egwu na-atụ ndị mmadụ ịpụta ezi ka mgbọ egbe aghara ịtụ ha.

Otu onye ọrụ nchekwa ime obodo n'Akpawfu bụ Okey Ugwuede gwara BBC na nke a ga-eme ya ugboro anọ ndịagha na-awakpo obodo ha n'ihi ebubo na ndị ESN nwere ọgige nzuzo n'ime ọhịa ha.
Mgbe a jụrụ ya ma ọ bụ eziokwu na ndị ESN nọ n'ime ọhịa ahụ? Okey sịrị na uche nke ya dịka onye nchekwa, na ọ bụghị eziokwu.
Ka ọ dị ugbua ọtụtụ ndị e durula ezinaụlọ ha gbapụ n'obodo ahụ n'ihi egwu maka na ha amaghị ebumnobi ndịagha a.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndịagha ngalaba 82 Div. n'Enugwu bụ Maj. Unuakhalu, ọ sị na ọ nụbeghi maka nke ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ga-eme nyocha ma zaghachị BBC Igbo ajụjụ.
Nke a bụghị mbụ akụkọ mwakpo ndịagha n'obodo a ga-adapụta.
N'ọnwa Julaị, afọ 2021, ndịagha wakpokwara obodo Akpawfu ma kwuo na ha na-achọ ndị otu ESN zoro n'ebe ahụ.










