'Lee etu e si wakpoo obodo dị n'Akpugo dị na Nkanu Enugwu Steeti' - Ndị Akpugo

Obodo Akpugo na Akpawfu dị na Nkanu Enugwu Steeti ka nọ na obi mmapụ ugbua n'ihi na ha amaghị ihe kpatara ndị agha ala anyị jiri wakpoo ha ụbọchi abụọ.
Dịka anyị siri chọpụta, ya bụ ọdachị malitere ụbọchi wenezde 30th June ka oji ọkara gachaa elekere asaa nke mgbede.
Ndị agha ahụ ji ụgbọ ala karịrị asaa site na Orie mba Akpugo banye na ụzọ bara Akpawfu. Ha gara n'ụlọ ọtụtụ ụmụ okorobia ma kpụru ha.
Ka anyị rutere na ahịa Ikoro Akpawfu, ahịa na azụ ka okwesiri. Osote Igwe Akpawfu bụ Mazi Bnam Be Edeh kọwara na ya enweghị ike ịkọwa ihe kpatara ya bụ mwakpo kama na ha chere na onwere ike ịbụ maka ndị si Oruku gbata ọsọ ndụ na be ha.
Otu onye ikorobịa gwara BBC na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na ha amaghị ihe mere e ji awakpo ha.
N'Ugwuagbụ Akpugo agbara ụlọ otu onye dibia aha ya bụ ejioffor ọkụ.
Ndị uweojii na ndi agha Naịjirịa ekwubeghi ihe ha ma maka mwakpo a mana BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ.
Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe zara ekwenti ya mana ọ si ka e zitere ya ozi n'ọnọdụ a kpọrọ "text message".









