Etu ndị ojiegbe si gbagbuo mmadụ asaa n’Orogwe, Imo Steeti

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị oji egbe ha na-eche bụ Eastern Security Network (ESN) wakporo ụlọ otu nwoke dị n’Orogwe, nke okpuruọchịchị Owerri West.

Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na ndị a bu otu ụgbọala na ọgbatumtum atọ bịa ma malitere ịgba egbe agharaghara n’ụlọ nwoke bụ onye a sị bi na Legọs.

Ha gbagburu mmadụ asaa ha nwụọ pịị ebe mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ n’oge ahụ.

Kọmishọna uweojii bụ Mohammed Ahmed Barde

Ebe foto si, Imo State Police

Abattam sị na ngwa ngwa ndị uweojii nụrụ maka nke a ha wuchiri ebe ahụ mana ọ bụrụ na ndị ojiegbe a eriela mbọmbọ ọsọ.

Ha buuru ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ gawa n’ụlọ ozi dị na Federal Medical Centre Owerri bụkwa a na-agwọ ndị merụrụ ahụ.

Ọ sị na kọmishọna uweojii bụ Mohammed Ahmed Barde enyela iwu sị ka ndị ọrụ ya sie imi n’ala chọpụta ma nwuchie ndị kpara arụ a.

Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ nyere ndị uweojii aka n’ịchọpụta ndị ekperima site n’ịgbama ihe ọbụla dị aṅaa na gburugburu ha.

Ihe anya hụrụ ka ihe si mee kwuru

Ime obodo

Otu onye obodo na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na nsogbu a malitere mgbe ndị nchekwa Ebubeagu bịara n’Orogwe ma buru otu nwokoroọbịa.

“Nke a mere ndị ojiegbe jiri wuchie n’abalị ụbọchị Mọnde n’otu ụlọ a na-arụ arụ ma malite ịgba egbe gbagbuo mmadụ asaa.”

“Mgbọ egbe tụtara otu nwoke na-agba ọgbatumtum bụ onye so na ndị e bu gawa ụlọọgwụ.”

Ọgbaghara butere oke egwu n’obodo Orogwe nke mere ọtụtụ ndị obodo jiri gbaa ọsọ n’ụbọchị Tuzde ka a ghara ịbịa nwuchie ha.