Etu ndị oji egbe si gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'akwamozu emere n'Anambra steeti

Marakwa na foto a esighi n'Obodo Ebenebe bụ ebe ihe a mere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Marakwa na foto a esighi n'Obodo Ebenebe bụ ebe ihe a mere

Ọsọ tara n'obodo Ebenebe nke Anambra steeti n'ụbọchị Satọdee dịka ndị oji egbe wakporo akwamozu ebe ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gbara BBC Igbo ama na ọtụtụ nwụrụ dịka ha enyochapụtabeghi kpọmkwem mmadụ ole ha dị nwụrụ na mkpamkpa a kpara n'obodo Ebenebe, nke dị n'okpuruọchịchị Awka North, Anambra steeti n'ụbọchị Satọdee.

Ka akụkọ si kwuo, ndị oji egbe e kwuru a na-eche bụ ndị otu nzuzo wakporo akwamozu otu nwoke n'obodo ahụ.

E kwuru na ndị a pụtara gbawa egbe aghara aghara ebe ahụ.

Ụfọdụ na-ekwu na ihe ruru mmadụ 20 nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Ka Ikenga si kwuo, "Anyị na-eche na ndị mere ihe a bụ ndị otu nzuzo bịara ibuso ndị iro ha agha"

O gara n'ihu kwuo:

"Nnyocha anyị na-egosi na onye a na-eme akwamozu ya ebe ahụ nwereike ịbụ onye otu nzuzo ọzọ nke bụ onye iro ndị a bịara wakpoo ya bụ akwamozu"

Ikenga kwuru na ha nụrụ ozi mwakpo a n'oge n'ụbọchị Satọdee.

Dịka nke a na-eme, ndị uweojii ekwubeghi mmadụ ole ha nyochapụtarala nwụrụ ebe ahụ ugbua.

Ikenga gwara BBC Igbo na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Echeng Echeng nụrụ ozi ihe a mere ma zịga ọtụtụ ngalaba ndị uweojii ebe ahụ maka ichekwa udo obodo ahụ.

O kwuru na ọtụtụ ndị otu ha nọ ebe ahụ eme nnyocha ima ka ihe a mere si malite ma weghachite udo ebe ahụ.

O kwukwara na ha na-agba mbọ ịnwụchị ndị mere ihe a ugbua.

Ọtụtụ mwakpoo adapụtala n'Anambra steeti na nso nso a.

Ọnọdụ enweghị nchekwa na-eselite isi ya n'Anambra steeti dịka ọtụtụ steeti ndị ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-ata ahụhụ n'aka ọtụtụ mwakpoo.

Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu nwereonwe nke Indigenous People of Biafra (Ipob) , nakwa ndị otu nchekwa ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) na-akpa ajọ ike a.

Mana ugboro ugboro ka ndị Ipob etiela mkpu na aka ha adịghị na ya.

Nke a bụ izizi na nso nso ndị uweojii na ebo ndị otu nzuzu ebubo maka mwakpo mere mpaghara ahụ.