Etu ndị 'unknown gunmen' si wakpoo Uli, Anambara steeti

Mmemme ahụike ahụ ebe mwakpo mere

Ebe foto si, uligadi

Ndị bu egbe wakporo ọgbakọ e kpokọbara iji nyere ọha mmadụ nleta ahụike n'efu Eziama, Uli dị nokpuru Ọchịchị Ihiala, Anambara steeti ụbọchị Wenezde.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na omekome ahụ wakporo ebe otu ndị Uli bi ofesi haziri maka nleta ahụike akpọrọ 'Uli Global Ambassadors for Development Initiative (ULIGADI)' gbwaliwe egbe elu.

Ndị ahụ adịghị na ndị na ahazi nleta ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ ndụ.

Otu onye otu ahụ achọghị ịkpọ aha ya n'ihi na o nweghị ikike ya na ndị ntaakụkọ ikwu banyere ihe mere gwara BBC Igbo na o mere n'ezie.

Onye ahụ onye gbara ama na Kọmishona ndị uweojii Anambra steeti amatala maka ihe mere, ekweghị ekwu ma kepukepu na egburu mmadụ na ọdachi ahụ abụ ezuiokwu.

Mbọ BBC gbara inweta olu ndị uweojii steeti amịtaghị mkpụrụ dịka Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya.

BBC Igbo gbakwara mbọ ịnweta onyeisioche otu ahụ (ULIGADI) bụ Emeka Okonkwo mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

Cheta na nsonso a, ndị o ji egbe gara kposaa ọkakpọ achumta vootu ndị Apga mere n'ihiala tupu ntuliaka gọvanọ Anambra e mere n'ọnwa Novemba afọ 2021.