Unknown Gunmen in Anambra State: Ọ bụ Gọvanọ Obiano ka ndị ojiegbe wakporo n'Ihiala Oktoba 12?

Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook
Akụkọ na-ewu na soshal midia na-ekwu na ndị ojiegbe wakporo ụgbọala Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano taa bụ Tuzde.
Mana otu onye nọ ebe ihe a mere gwara BBC Igbo na ọ bụ ebe ndị pati APGA na-eme emume ịchụ nta vootu ha n'ụlọakwụkwọ Odoata Primary School dị n'Ihiala ka e mere mwakpo ahụ.
Onye ahụ kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gbawakwara egbe ma chụọ ndị ekperima ahụ ọsọ ụkwụ eru ala.
Ndị uweojii Anambra steeti kwuru na mwakpo dị otu ahụ mere.
Lee ihe gọọmentị Anambra kwuru banyere mwakpo a

C-Don Adinuba, bụ Kọmishọna mgbasaozi Anambra steeti, kwuru na ndị ọrụ nchekwa chụsara ndị ojiegbe wakporo emume ịchụnta vootu ndị APGA n'Ihiala.
Adinuba kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde.
O kwuru na ndị ekperima ahụ bucha ọgbatumtum nakwa ụgbọala atọ wee mee mwakpo ahụ.
Adinuba kwuru na oge ndị ọrụ nchekwa malitere ịkwa ndị ekperima ahụ mgbọ, ha gbabara n'ime ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes' nke dị nso ebe ahụ.
"Ihe zọrọ ndị ekperima ahụ bụ na ha gbabara ebe ndị ọrụ nchekwa enweghị ike ịgba egbe," Adinuba kwuru.
"Ndị ọrụ nchekwa jichiri ụgbọala na ọgbatumtum niile ndị ekperima ahụ jiri mee mwakpo ahụ."
Lee ihe ndị uweojii kwuru

Ebe foto si, Toochukwu Ikenga
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Toochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii chụsara ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ Odata Central School nke dị nso n'ụlọụka Katọlik 'St Martin' dị n'Ihiala.
Ikenga kwuru na ọ bụ n'elekere itoolu na ọkara nke ụtụtụ Tuzde ka ihe a mere.
Ọ kọwara na ndị uweojii jichiri otu egbe AK47, mgbọegbe karịrị iri atọ, otu ụgbọala 'Lexus 350', otu ụgbọala 'Rav 4', ụgbọala 'Mercedes', na ụgbọala 'Toyota Corolla'.

Ebe foto si, Anambra Police Command
Ikenga kwukwara na onweghị onye uweojii ọbụla nwụrụ na mwakpo ahụ.
"Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-akpagharị n'okirikiri ahụ ịchọ ndị ekperima ahụ na-agba ọsọ."

Ebe foto si, Anambra Police Command
Nke a abụghị nke ụdị ihe a na-eme kamgbe ntuliaka Anambra steeti rutewere nso.
Cheta na ndị ekperima wakporo ọgbakọ ebe Chukwuma Soludo na ndị ntorobịa na-enwe ọgbakọ n'obodo ya bụ Isuofia.
Ha gburu ndị uweojii abụọ na-eche Soludo nche n'oge ahụ.
Mana ndị uweojii kwuru na ha mechara nwuchie ndị kpara arụ ahụ.












