Anambra Governorship Election: Obi siri m ike na m na m ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra - Chukwuma Soludo

Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

Chukwuma Soludo ekwuola na obi siri ya ike na ọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 6.

Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV na mgbede Mọnde, dịka otu ụlọikpe dị n'Awka, Anambra steeti, nyere iwu ka INEC tinyeghachi aha ya dị ka onye ga-anọchi pati APGA na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti.

Mana ọtụtụ na-ekwu na ya okwu ebibeghị, n'ihi na ụlọikpe ka elu ekpebibeghị ya bụ ikpe.

Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe 'high court' abụọ enyela mkpebi n'okwu gbasara APGA n'Anambara steeti, nke pụtara na ọ bụ ụlọikpe 'appeal court' ga-ekwuzi ihe Inec ga-eme.

Lee ihe bụ isiokwu

Cheta na ngalaba 'Independent National Electoral Commission' wepuru aha Soludo ma tinye aha Chukwuma Umeoji n'akwụkwọ ha biputara n'izuka gara aga.

Nke a bụ maka na pati APGA kere ụzọ abụọ ma nwee mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisioche, Victor Oye na Jude Okeke.

Aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ n'Anambra steeti

Ebe foto si, INEC

Nkọwa foto, Aha INEC wepụtara maka ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ n'Anambra steeti

Otu ụlọikpe dị na Jigawa nyere iwu na ọ bụ Jude Okeke bụ ezigbo onyeisi Apga na Naịjirịa, ọ bụghị Victor Oye.

Nke a mere ka INEC were aha Chukwuma Umeoji, bụ aha nke otu Jude Okeke zigara, ma hapụ Soludo bụ aha otu Victor Oye zigara.

Aha ndị niile na-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra

Ebe foto si, Inec/Websait

Aha ndị niile na-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra

Ebe foto si, Inec/Websait

Mana taa bụ Mọnde ka ọkaikpe Valentine Okaa nyere iwu n'Awka na ọ bụ Victor Oye bụ onyeisioche APGA n'Anambra steeti, nke pụtara na ọ bụ ntuliaka nke ha haziri ka INEC ga-ewere.

Soludo vs Umeoji

Ebe foto si, APGA Interactive Forum/Facebook

Nkọwa foto, Mkpebi ikpe gbasara ọchịchị APGA n'Anambra steeti

Otu n'ime ndị enyemaka mgbasaozi Soludo bụ Mazi Ejimoro Opara gwara BBC Igbo na nke a mere eme n'ụbọchị Mọnde a.

Ejimofor kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ụlọikpe ukwu steeti etinyeghachila Soludo dịka onye ga-anọchi anya APGA na ntuliaka Novemba 6."

"Ụlọikpe ahụ kwukwara na ọ bụ Victor Ike Oye bụ onyeisi APGA na Naịjirịa."

Mkpebi ikpe gbasara ọchịchị APGA n'Anambra steeti

Ebe foto si, APGA Interactive Forum/Facebook

Nkọwa foto, Mkpebi ikpe gbasara ọchịchị APGA n'Anambra steeti

Ejimofor gara n'ihu kwuo na ọ dịziiri INEC ugbua itinyeghachi aha Soludo dịka ụlọikpe si nye iwu.

Ọ kọwara na ụlọikpe dị na Jigawa nke nyeburu iwu na Victor Oye abụghị onyeisi APGA enweghị ikike inye ya bụ iwu n'ihi na ebe esemokwu na-ada bụ n'Anambra.

Ndị ọkaiwu anyị ka na-agakwa okwu ya iji hụ na INEC tinyeghachiri aha Soludo.

Mkpebi ikpe gbasara ọchịchị APGA n'Anambra steeti

Ebe foto si, APGA Interactive Forum/Facebook

Nkọwa foto, Mkpebi ikpe gbasara ọchịchị APGA n'Anambra steeti

Ihe Chukwuma Umeoji kwuru

Mana Azubuike Okafor, bụ onye na-akwado Chukwuma Umeoji gwara BBC na INEC agaghị eme ihe ụlọikpe ahụ dị n'Awka kwuru.

Okafor kwuru sị: "Okwu a nọzi n'ụlọikpe mkpesa bụ 'appeal court' ugbua, nke a pụtara na ọ gafeela ihe ụlọikpe steeti ga-ekpebi."

"Ka ọ dị ugbua, INEC ejirila mkpebi nke ụlọikpe Jigawa nyere rụba ọrụ. Ha eweputela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ, ha agaghị alaghachi azụ ugbua n'ihi mkpebi ụlọikpe nke dị n'Awka."

"Ọ bụ naanị ụlọikpe karịrị ụlọikpe 'hgh court' nwere ike ikwu ihe ọzọ INEC ga-ege ntị."