Anambra Governorship Election: Mkposa e kposara ọchịchị PDP Anambra, ọ ga-enye ha nsogbu na ntuliaka 'Primary' ha?

PDP

Ebe foto si, Getty Images/Facebook

Nkọwa foto, Peter Obi, aka chịbụrụ Anambra steeti bụ onye otu PDP, ebe Uche Secondus bụ onyeisi PDP na Naịjirịa

Ndị isi pati 'Peoples Democratic Party' n'Abuja ekposaala ọchịchị pati PDP nke Anambra steeti.

Nke a si n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Kola Ologbondiyan wepụtara n'ụtụtụ Fraịde.

Ologbondiyan kwuru na nke a bụ n'ihi mkpebi nke ụlọikpe nyere n'ọdị nso a gbasara ọchịchị pati PDP n'Anambra.

Ka ọ dị ugbua, ndị isi pati PDP na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ga na-achịkọta PDP nke Anambra ruo mgbe a haziri ndị ọchịchị ọhụrụ na steeti ahụ.

Ologbondiyan kwukwara na a họpụtala mmadụ ise bụ ndị ga-achịkọta ntuliaka imeụlọ nke ndị PDP Anambra ga-eme n'ụbọchị 26 nke ọnwa a iji họpụta onye ga-anọchi ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke ga-adị n'ọnwa Nọvemba.

Samuel Ortom

Ebe foto si, PDP

Nkọwa foto, Samuel Ortom bụ onyeisi kọmiti ga-ahazi ntuliaka imeụlọ nke Anambra steeti

Mmadụ ise ahụ bụ:

  • Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue State - Onyeisi
  • Philip Shaibu, Osote Gọvanọ Edo Steeti - Ode akwụkwọ
  • Gọvanọ Bala Mohammed
  • George Kaika
  • Habiba Muhammed Deen

Ọgụ dị n'ime APGA na PDP ọ ga-abụ uru ndị APC n'Anambra?

PDP/APGA

Ebe foto si, PDP/APGA

Nkọwa foto, Peter Obi chịburu Anambra Steeti nọ na PDP ebe Willie Obiano na-achị ugbua nọ na APGA

Ịchụ nta vootu amalitela n'ozuzu oke n'Anambra steeti maka onye ga-anọchi anya Gọvanọ Obianọ.

Ọtụtụ na-ekwu na otu ndọrọndọrọ a ga-aka lekwasị anya na ntuliaka a bụ ndị 'All Progressives Congress' (APC), All Progressive Grand Alliance (APGA), na 'Peoples Democratic Party' (PDP).

Mana ndị pati APC na-ekwu na ọgụ dị n'etiti APGA na PDP ga-enyere ha aka na ya bụ ndọrọndọrọ.

APGA

Victor Umeh na Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

N'ụbọchị Wenezde ka Chukwuma Soludo tuuru ugo dịka onye ga-anọchite anya ndị APGA na ntuliaka Anambra.

Mana APGA kere ụzọ abụọ, otu ụzọ bụ nke Jude Okeke nọ n'isi ya, nke ọzọ bụ nke Victor Ike Oye nọ n'isi ya.

APGA

Ebe foto si, APGA

Nkọwa foto, Gọvanọ Willie Obiano, Victor Ike Oye (Onyeisi APGA), na Victor Umeh (onye chịburu APGA)

Ọ bụ otu nke Ike Oye ka Gọvanọ Obiano na Soludo nọ na ya, mana otu nke Jude Okeke na-ekwu na haachụọla Soludo n'otu ha.

Ya bụ ihe na-adị ụfọdụ ka ọ bụ egwuregwu, mana ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ụdị ihe a mere na Rivers nakwa Zamfara steeti, ebe INEC chụpụrụ pati APC n'ihi na ha adịghị n'otu.

PDP

Peter Obi

Ebe foto si, PDP Anambra State/Facebook

Nkọwa foto, Aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi nọ na pati PDP

N'aka nke ọzọ, PDP bụ pati nke aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi nọ na ya.

Mana ya bụ pati kekwara ụzọ abụọ, otu bụ nke onyeisi ya bụ Ndubuisi Nwobu, nke ọzọ bụ nke onyeisi ya Ejike Oguebego.

Ụlọ ntaakụkọ Daily Trust dere etu nkewa a si adọri PDP, nke pụtara na ntulaiaka ọkwa Gọvanọ n'Anambra nwere ike ịkwa ha.

Mgbe BBC kpọturu Nnamdi Nwangwu, ọnụ na-ekwuru ndị PDP Anambra steeti, o wee kwuo na "onweghị nkewa dị na PDP".

"Onyeisioche PDP n'Anambra bụ Ndubuisi Nwobu. Ejike Oguebego bụ onye chịrị PDp n'oge gara aga."

Nwangwu kwuru na PDP na-akwado nke ọma maka ntuliaka imeụlọ ha nke ga-adị n'ụbọchị Satọdee, abalị 26 nke ọnwa June.

APC

APC

Ebe foto si, APC Anambra Konnect/Facebook

APC bụ ndị nwere ike irite uru na nkewa a dị na PDP nakwa APGA, maka na ala adịghị mma bụ uru ndị nze.

Ọ bụ na pati a ka Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ, bụ Chris Ngige, nọ na ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị APC n'Anambra bụ Okelo Madukaife, kwuru na ha adịla njikere ịchutu maka ntuliaka nke imeụlọ ha.

"Anyị anaghị eku ume etu ha (PDP na APGA) si eku ume," Madukaife na-ekwu.

Onye na-atụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

"Onye ọbụla bụ onye APC ga-eso tụọ vootu iji kwuo onye ha chọrọ ka ọ nọchite anya pati anyị."

Gbasara okwu nkewa dị na APGA nakwa PDP, Madukaife kwuru na "ọ bụ ekpere ka m na-ekpe ugbua."

Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ iri na anọ egosila mmasị ha na APC iso zọọ ọkwa gọvanọ na ya bụ pati.

Ihe mere mbụ o nwere ike ime ọzọ?

APC Rivers state

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, INEC anabataghị APC na ntuliaka 2019 na Rivers steeti n'ihi ọgụ ime ụlọ

Cheta ihe mere pati APC na Rivers steeti nakwa Zamfara steeti na ntuliaka 2019.

Na steeti abụọ, APC kewara abụọ nwee ndị isi oche dị icheiche.

Otu abụọ a mechara ntuliaka 'praịmarị' n'otu n'otu ma wepụtakwa ndị ha sị ga-anọchite anya ha.

Mana ngalaba INEC anabataghị nke ọbụla n'ime ha n'ihi na ha agbasoghi iwu ntuliaka.

Nke a megidere ruo mgbe oge INEC nyere maka idebanye aha ndị ga-eso zọọ ndọrọndọrọ gafere, nke mere ka a chụpụ ha.