Anambra State: Igwe Kelly Nzekwe nke Igbariam alakwurula ndị ichie

Igwe Kelly Nzekwe

Ebe foto si, Euphemia Anwulilka Ubanoh

Eze ndị Igbariam dị n'Okpuru ọchịchị Anambra-East bụ Igwe Kelly Nkeli Nzekwe a ma dịka Okalakwu Igbariam, anwụọla.

Igwe Kelly nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na Nnewi n'ụbọchi Tozde ka ọ rịachara ahụ obere oge.

Igwe Kelly so na ndị eze ọdinala iri na-abụọ Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano kwụsịburu ọrụ maka iso Arthur Eze gaa n'obi Gọọmentị etiti n'Abuja ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari.

Nke a bụ maka na ha anataghị ikike n'aka Gọvanọ Obiano mee njem ahụ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2020. Mana Obiano kpọghachiri ya n'ọkwa n'abalị mbụ nke afọ 2020.

Igwe Kelly Nzekwe

Ebe foto si, Euphemia Anwulilka Ubanoh

Dịka o megidere omenala ụfọdụ ikwu na Igwe obodo nwụrụ na-emeghị omenala kwesịrị, otu n'ime ndị ichie obodo Igbariam bụ Chief Lawrence Anikpe, Ọnwa Igbarịam, gwara BBC Igbo na "Igwe Kelly jere ife."

Ichie Anikpe kwuru na "Igwe Kelly gbachaa ọfala nke e hiwere ka anyị ga-agwa ndị mmadụ ebe ọ jere."

Ọ kọwara na "ọ bụ n'abalị mbụ nke ọnwa jenụwarị ka o kwesiri ịgba ọfala mana anyị akwadoro ọfụma n'ihi na a kwụsitụrụ ya ọrụ."

Nke a mere ka e higharịa ya gawa n'ọnwa Maachị"

Aha onyonyo, 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze'

Ọ kọwara Igwe Kelly dịka "Odogwu nwoke Chukwu wepụtara n'Igbarịam."

Tupu ọ nwụọ , Igwe Kelly bụ ojiegoachụego a na-anụ aha ya.

Aha onyonyo, Arthur Eze kwanyere Gọvanọ ugwu ruru ya - Chris Ngige

Anikpe kọwara na Igwe Kelly nwere ọtụtụ ụlọọrụ gụnyere Belinda Oil & Gas na Oguegbuna Transport.

Kemgbe akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe, ụfọdụ na-ekwu na ọbụ obi nkoropụ n'ihi esemokwu dị n'etiti Igwe Kelly na Gọvanọ Obiano.

Mana Kọmishọna mgbasaozi Anambara steeti bụ Don Adinuba kwuru na ọ bughị eziokwu.

O kwuru na ọ bụ akụkọ nke ụgha ndị nkwado aka chiburu Anambra steeti na-agbasa na soshal midia.

Adinuba gara n'ihu kwuo na e liela Igwe Kelly nke obodo Igbariam a nwụrụ anwụ.

N'otu aka ahụ, Ichie Anikpe kwukwara na "ọ bụghị eziokwu" na e nwere esemokwu dị n'etiti Gọvanọ Obiano na Igwe Kelly.

Ọ kọwara na Gọvanọ kwụsịburu Igwe Kelly ọrụ maka ịga n'Abuja izute Buhari "mana ha ekpeziela nke mere ka akpọghachite ya n'ọkwa ya."

Na nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọchịchị Gọvanọ Obiano, na-ahụta Igwe Kelly dịka onye na-akwado aka chiburu Peter Obi.

Akụkọ ga-amasị gị: