Idumuje Ugboko: Etu ndị uweojii si wakpo Idumuje Ugboko ma tọrọ eze ha

Obi Chukwunonso Nwoko na Ned Nwoko
Nkọwa foto, Obi Chukwunonso Nwoko, eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko na Ned Nwoko

Ndị uweojii wakporo obi eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko nke dị na Delta Steeti bụ Obi Chukwunomso Nwoko ma tọrọ ya n'elekere mbụ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị Satọde.

Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ onye ọgaranya a ma ama bụ Ned Nwoko zitere ndị biara ije ahụ.

Aha onyonyo, Historical Building: Ihe dị omimi maka ụlọ aja ụpa na-enye ndị Idumuje Ugboko ndo

Mazi Igwe Enuoyibo, otu n'ime ndị okenye obodo ahụ, kwuru na ọ bụ okwu gbasara ala mere e ji tọrọ eze ha.

Mana Ned Nwoko gwara BBC Igbo na ihe niile ahụ bụ asịrị.

Gịnị na-ese?

Ala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ọ bụ ala nke Ned Nwoko chọrọ iji rụọ Mahadum bụ ihe na-ese okwu

Dịka Mazi Enuoyibo si kwuo, o ruola afọ atọ okwu ala bidoro isere ndị obodo ha na Ned Nwoko.

Enuoyibo kwuru sị: "Ned Nwoko nwere ala dị hekta iri atọ na atọ (33 hectares) n'Ugboko, bụ nke e nyere ya n'efu".

"O kwuru na ya ga-arụ nnukwu ebe a na-azụ ụmụ anụmanụ ma na-emepụtakwa nri si n'ahụ ụmụanụmanụ."

"Mana ọ bịakwara kwuo ka e nyekwuo ya ala ọzọ dị hekta iri itoolu na abụọ (92 hectares), n'agbanyeghi na ala nke o nweburu enwe ka fọrọ."

Enuoyibo kwuru na Ned Nwoko sị na ya chọrọ iji ala ahụ arụ mahadum, mana mgbe ndị obodo jụrụ inye ya ala ahụ, ọ malitere iwere ala ndị mmadụ n'ike.

Aha onyonyo, Ihe mere ụlọ aja jiri bụrụ ọkachamma na mpaghara Afịrịka - Demas Nwoko

Ọ jụrụ sị, "Ọ bụrụ na otu onye nwee ala karịrị hekta otu narị na iri abụọ (120 hectares) n'otu obodo, olee nke ndị obodo ndị ọzọ ga-enwezi?"

Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Ned Nwoko, ọ zaghị ekwentị ya mana o mechara saghachi ozi anyị zigaara ya.

O dere sị: "Biko gbachipụ ndị asịrị nkịtị. Ị chọọ ịmata nke bụ eziokwu, kpọtụrụ onyeisi ndị uweojii n'Asaba."

Anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya ugboro ugboro mana ọ azaghị.

Onovwakpoyeya asabeghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị.

Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na okwu ala a dị n'etiti Ned Nwoko na ndị Idumuje Ugboko oteela ọ malitere.

Ụfọdụ akụkọ kwuru na oge Eze ọdịnala chịburu Idumuje Ugboko bụ Obi Albert Nwoko dị ndụ, o binyere aka n'akwụkwọ inye Ned Nwoko ala ahụ ọ chọrọ iji rụọ Mahadum.

Mana oge ọ nwụchara, nwa ya nwoke onye bụzi Eze ugbua, bụ Chukwunonso, kagburu nkwekọrịta nke nna ya na Ned nwere.

Mana anyị amatachabeghi nke bụ eziokwu.

Ebee ka Obi Chukwunomso nọ ugbua?

Obi Chukwunonso Nwoko (IV)

Ebe foto si, idumujeugboko.com

Nkọwa foto, Obi Chukwunonso Nwoko (IV), eze ọdịnala ndị Idumuje Ugboko

Mazi Enuoyibo kwuru na Eze ha ka nọ n'aka ndị uweojii nke Delta Steeti.

O kwuru na ha amabeghị ebubo ndị uweojii boro ya nke kpatara ha ji were etiti abali wakpo ya.

Enuoyibo zitere onyonyo etu ndị uweojii si gbakaa ụzọ ma tụọ anwụrụ na-agba anya mmiri (tear gas) tupu ha akpụrụ Eze ha.