Anambra state: Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ

Aha onyonyo, Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ

Dịka a kwachara ozu Eze Christopher Nwabunnwanne Idigo nke Anọ bụ Eze Aguleri nwụrụ anwụ, e chiri Dr Michael Chinenye Idigo eze.

Mana ọchịchị ya na-apụta ụka dịka ndị ọ bụ ọrụ ha ịkpọpụta onye ga-abụ eze n'Aguleri kwuru na ọ bụghị onye ha họpụtara ka e chiri.

Ha boro Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano ebubo na ọ manyere ndị Aguleri eze ọhụrụ ahụ n'olu.

Mana ọnụ na-ekwuru Obiano bụ James Eze, kwuru na aka Gọvanọ adịghị na nhọpụta Eze Aguleri ọhụrụ.

O kwuru na naanị ihe gọvanọ mere bụ inye ndị obodo họpụtara, asambodo njirimara.

Akụkọ ga-amasị gị: